Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jenụwarị 2
IZU NA-AMALITE NA JENỤWARỊ 2, 2012
Abụ nke 118 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 15 ¶1-7, igbe dị na p. 116 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Aịzaya 24-28 (Nkeji 10)
Nke 1: Aịzaya 27:1-13 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Echekwala na Jehova Ahụghị Gị n’Anya—Aịza. 57:15 (Nkeji 5)
Nke 3: Iji Ihe Oyiyi na Ihe A Kpụrụ Akpụ Efe Ofufe Bụ Ịkọcha Chineke—td 17A (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ịma ọkwa. Jiri ihe dị na peeji a, bụ́ ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu,” mee ihe ngosi otú e nwere ike isi malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa Jenụwarị.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 15: Otú E Nwere Ike Isi Nye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Jenụwarị. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri otu nkeji ma ọ bụ nkeji abụọ kwuo isiokwu ụfọdụ ga-amasị ndị bi n’ókèala unu. Gwazie ndị na-ege ntị ka ha kwuo ajụjụ ha ga-ajụ ndị nwe ụlọ ma ha chọọ iji isiokwu ndị mbụ gbara n’Ụlọ Nche Jenụwarị 1 nye ha magazin ahụ. Ha kwuokwa amaokwu Baịbụl ha nwere ike ịgụrụ ha. Meekwa otu ihe ahụ na Teta! Jenụwarị–Mach 2012. Ọ bụrụkwa na oge ka dị, họrọ isiokwu ọzọ n’Ụlọ Nche ahụ ma ọ bụ na Teta! ahụ ma jụọ ndị na-ege ntị otú ha ga-esi jiri ya nye mmadụ magazin ahụ. Gbaa ndị nkwusa ume ka ha gbaa mbọ hụ na ha gara ebe ndị mmadụ na-ere ihe nye ha Teta! Gwa onye nlekọta ije ozi ka o kwuo ndokwa ọgbakọ merela maka ya. Mee ihe ngosi otú e nwere ike isi nye Ụlọ Nche Jenụwarị 1 na Teta! Jenụwarị–Mach 2012. Ihe ngosi nke Teta! ga-egosi otú e nwere ike isi nye ndị nọ ebe a na-azụ ahịa magazin.
Abụ nke 86 na Ekpere