Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Disemba: Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere ụmụaka, nye ha akwụkwọ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ ma ọ bụ Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible. Jenụwarị: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịa ka ị malitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’ụbọchị mbụ i ziri ha ozi ọma. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere akwụkwọ Bible Na-akụzi ma ha achọghị ka e duziwere ha ọmụmụ Baịbụl, e nwere ike nye ha magazin ọ bụla merela ochie ma ọ bụkwanụ broshuọ ọ bụla ga-amasị ha. Febụwarị: Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ na Bịaruo Jehova Nso. Mach: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịa ka ị malitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’ụbọchị mbụ i ziri ha ozi ọma.
◼ A ga-echeta Ọnwụ Jizọs na Tuzdee abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Mach, afọ 2013.