Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Febụwarị: Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ ma ọ bụ Bịaruo Jehova Nso. Mach: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịa ka ị malitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’ụbọchị mbụ i ziri ha ozi ọma. Eprel na Mee: Ụlọ Nche na Teta! Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ nwere mmasị, nye ya traktị bụ́ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu? Gbalịakwa malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Mgbe ị gara nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, ma hà bụ ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs ma ọ̀ bụkwanụ ndị na-abịa nzukọ anyị ndị ọzọ ma ha anaghị eso eme ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ, gbaa mbọ nye ha akwụkwọ Bible Na-akụzi, gbalịakwa jiri ya malitere ha ọmụmụ Baịbụl.
◼ Isiokwu okwu ihu ọha pụrụ iche a ga-ekwu n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ: “Ọgwụgwụ Ọ̀ Dịla Nso Karịa Otú I Chere?” A ga-ekwu ya ná ngwụcha izu nke izu ahụ a ga-eme Ncheta Ọnwụ Jizọs.
◼ N’afọ ọ bụla, a na-edepụta akụkọ ozi Ndịàmà Jehova bi ná mba niile. A na-edepụtakwa adres mba ọ bụla anyị na-ekwusa ozi ọma n’enweghị nsogbu na peeji ikpeazụ na-adị n’akwụkwọ Yearbook kacha ọhụrụ. Ọ bụrụ na nwanna chọrọ ịga mba ọzọ, ma ya abụrụ na e deghị aha mba ahụ n’ebe abụọ a, o kwesịrị idetara alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ iji mara otú ihe si kwụrụ ebe ahụ. Ya bụrụ na a machibidoro ọrụ anyị iwu, e nwere ike ịgwa ya ihe ọ ga-eme. (Mat. 10:16) Ná mba ụfọdụ, o nwere ike ịka mma ka Onyeàmà bịara abịa ghara ịgakwuru Ndịàmà bi ebi ma ọ bụkwanụ jụwa ajụjụ mgbe ha na-enwe ọmụmụ ihe. Alaka ụlọ ọrụ nwekwara ike gwa onye ahụ otú e si na-agba àmà ná mba ahụ na otú ọ ga-esi eme ma ọ bụrụ na e nwere akwụkwọ anyị ndị o ji aga. Ọ bụrụ na anyị emee ihe a e kwuru ebe a, ọ ga-eme ka anyị ghara ịbanye ná nsogbu, meekwa ka anyị ghara ịkpatara ụmụnna anyị ndị bi ná mba ebe anyị chọrọ ịga nsogbu.—1 Kọr. 14:33, 40.