Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mach 5
IZU NA-AMALITE NA MACH 5
Abụ nke 103 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 17 ¶15-19 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jeremaya 1-4 (Nkeji 10)
Nke 1: Jeremaya 3:14-25 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Gịnị Mere Ihere Anaghị Eme Anyị na A Kpọkwasịrị Anyị Aha Jehova—Aịza. 43:12 (Nkeji 5)
Nke 3: Ọ Bụghị Mmadụ Niile Na-ejere Otu Chineke ahụ Ozi—td 20D (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Rite Uru n’Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị. Jiri nkeji ole na ole kwuo ihe e dere n’okwu mmalite dị n’akwụkwọ Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị nke afọ 2012. Gwazie ndị na-ege ntị ka ha kwuo oge ha ji atụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị nakwa uru ha riterela. Unu tụleekwa ihe e kwuru gbasara isiokwu dịịrị afọ 2012.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Otú E Nwere Ike Isi Nye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Mach. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri otu nkeji ma ọ bụ nkeji abụọ kwuo isiokwu ụfọdụ ga-amasị ndị bi n’ókèala unu. Gwazie ndị na-ege ntị ka ha kwuo ajụjụ ha ga-ajụ ndị nwe ụlọ ma ha chọọ iji isiokwu ndị mbụ gbara n’Ụlọ Nche Mach 1 nye ha magazin ahụ. Ha kwuokwa amaokwu Baịbụl ha nwere ike ịgụrụ ha. Meekwa otu ihe ahụ na Teta! Jenụwarị–Mach 2012. Ọ bụrụkwa na oge ka dị, họrọ isiokwu ọzọ n’Ụlọ Nche ahụ ma ọ bụ na Teta! ahụ ma jụọ ndị na-ege ntị otú ha ga-esi jiri ya nye mmadụ magazin ahụ. Mee ihe ngosi otú e nwere ike isi nye mmadụ Ụlọ Nche ahụ na Teta! ahụ.
Abụ nke 75 na Ekpere