Aịzaya
“Unu atụla egwu, n’ihi na agbapụtala m unu.+
Akpọrọ m unu aha unu.
Unu bụ ndị nke m.
2 Ọ bụrụ na unu agafewe mmiri, m ga-anọnyere unu.+
Ọ bụrụkwa na unu agafewe osimiri, ọ gaghị eri unu.+
Ọ bụrụ na unu agafewe ebe ọkụ dị, ọ gaghị ere unu,
Ire ọkụ agaghịkwa ere unu.
3 N’ihi na abụ m Jehova Chineke unu,
Onye Nsọ Izrel na Onye Nzọpụta unu.
Ejirila m Ijipt, Etiopia, na Siba
Kwụọ ụgwọ ka a gbapụta unu.
4 N’ihi na ejighị m unu egwu egwu.+
Agụrụ m unu ná ndị e kwesịrị ịkwanyere ùgwù. M hụkwara unu n’anya.+
M ga-eji ndị mmadụ gbanweta unu,
Jirikwa mba dị iche iche gbanweta ndụ* unu.
5 Unu atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere unu.+
6 M ga-asị ebe ugwu, ‘Hapụ ha!’+
M ga-asịkwa ebe ndịda, ‘Ejichila ha.
Sinụ n’ebe dị anya kpọlata ụmụ m ndị nwoke, sikwanụ ná nsọtụ ụwa kpọlata ụmụ m ndị nwaanyị.+
9 Ka mba niile zukọọ otu ebe.
Ka mmadụ niile zukọtakwa.+
È nwere chi ga-ekwuli ihe a?
Ma ọ bụ hà ga-emeli ka anyị nụ ihe mbụ ga-emenụ?+
Ka ha kwuo otú o si bụrụ na ihe ha mere ziri ezi, ka ha kpọpụtakwa ndị àmà ha,
Ka ha nụ ya, kwuokwa, sị, ‘Ọ bụ eziokwu!’”+
10 Jehova kwuru, sị: “Unu bụ ndị àmà m.+
N’eziokwu, unu bụ ndị ohu m* m họọrọ,+
Ka unu mara m, nweekwa okwukwe n’ebe m nọ,*
Ka unu ghọtakwa na anaghị m agbanwe agbanwe.+
Ọ dịghị Chi dị tupu mụnwa,
E wezụgakwa m, e nweghị chi ọzọ dị.+
11 Abụ m Jehova.+ E nweghịkwa onye nzọpụta ọzọ ma e wezụga m.”+
12 Jehova kwuru, sị: “Mgbe chi ọzọ na-adịghị n’ala unu,+
Ọ bụ m kwuru ihe ga-eme, zọpụta unu, meekwa ka a nụ ya.
N’ihi ya, unu bụ ndị àmà m. Abụkwa m Chineke.+
13 Anaghịkwa m agbanwe agbanwe.+
O nweghị onye ga-anapụtali m ihe m ji n’aka.+
M mewe ihe m chọrọ ime, ònye ga-egbochili m ime ya?”+
14 Jehova, Onye Mgbapụta unu,+ bụ́ Onye Nsọ Izrel,+ kwuru, sị:
“M ga-eji maka unu zie ndị agha ka ha gaa Babịlọn ma wepụchaa ihe e ji tụchie ọnụ ụzọ ámá,+
Meriekwa ndị Kaldia nọ n’ụgbọ mmiri, ha ana-eti mkpu n’ihi ahụhụ ha na-ata.+
15 Abụ m Jehova, Onye Nsọ unu,+ Eze unu,+ na Onye kere Izrel.”+
17 Ọ bụ ya na-akpụpụta ụgbọ ịnyịnya agha na ịnyịnya,+
Na-akpọpụtakwa ndị agha na ndị bụ́ dike n’agha. Ọ sịrị:
“Ha ga-edina ala. Ha agaghị ebili.+
A ga-egbu ha n’egbughị oge otú ahụ e si afụnyụ ọkụ dị n’owu mpanaka* n’egbughị oge.”
18 “Unu echetakwala ihe ndị gara aga.
Unu echegbukwala onwe unu gbasara ihe ndị gara aga.
Emewedịla m ya.
Ọ̀ bụ na unu amaghị gbasara ya?
20 Anụ ọhịa ga-akwanyere m ùgwù,
Ma nkịta ọhịa ma enyí nnụnụ,
Maka na emeela m ka mmiri dị n’ala ịkpa,
Meekwa ka osimiri dị n’ọzara,+
Ka ndị m, bụ́ ndị m họọrọ,+ ṅụọ mmiri.
23 Unu akpụtaraghị m atụrụ mgbe unu bịara ịchụ àjà a na-esucha ọkụ,
Unu achụghịkwa àjà dị iche iche iji too m.
Amanyeghị m unu ka unu wetara m onyinye.
Emeghịkwa m ka ike gwụ unu n’ihi na asịghị m unu wetara m frankinsens.+
24 Unu ejighị ego unu zụtara m okpete na-esi ísì ọma.
Unu ejighịkwa abụba si n’àjà ndị unu chụrụ mee ka afọ ju m.+
Kama, mmehie unu dị m ka ibu arọ.
Unu ejirikwala ajọ omume unu mee ka ike gwụ m.+
25 Ọ bụ m bụ Onye na-ehichapụ mmehie unu*+ n’ihi aha m.+
Agaghịkwa m echeta mmehie unu.+
26 E nwee ihe m chefuru, chetaranụ m. Ka anyị leba okwu mụ na unu anya.
Kwuonụ ihe gosiri na aka unu dị ọcha.
27 Onye mbụ bụ́ nna unu mehiere.
Ndị na-ekwuchite ọnụ* unu enupụrụla m isi.+
28 N’ihi ya, m ga-ewere ndị isi nke ebe nsọ ka ndị rụrụ arụ.
M ga-eme ka e bibie Jekọb,
Meekwa ka a kparịa ndị Izrel.+