Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite na Febụwarị 27, 2012. Ụbọchị e denyere n’akara ngebichi bụ izu a ga-eme ihe omume e si na ya nweta ajụjụ ahụ. E denyere ya ka i nwee ike mee nchọnchọ n’izu ahụ a ga-amụ ya.
1. Ò ziri ezi ikwu na ebere Jehova na-ebelata ikpe ziri ezi ya? (Aịza. 30:18) [Jen. 9, w02 3/1 p. 30]
2. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe Shebna mere mgbe a kwụsịrị ya ịbụ onye na-elekọta ụlọ Hezekaya? (Aịza. 36:2, 3, 22) [Jen. 16, w07 1/15 p. 8 para. 6]
3. Olee ihe akụkọ ahụ a kọrọ n’Aịzaya 37:1, 14-20 kwesịrị ịkụziri anyị gbasara ihe anyị nwere ike ime n’oge ihe siri ike? [Jen. 16, w07 1/15 p. 9 para. 1-2]
4. Olee otú ihe atụ ahụ dị n’Aịzaya 40:31 si agba ndị ohu Jehova ume? [Jen. 23, w96 6/15 p. 10-11]
5. Olee mwakpo a ga-awakpo ndị Jehova n’oge na-adịghị anya, nke mere okwu Jehova e dere n’Aịzaya 41:14 ji agba anyị ume taa? [Jen. 23, ip-2 p. 24 para. 16]
6. Gịnị ka anyị nwere ike ime iji gosi Jehova na anyị “na-achụso ezi omume”? (Aịza. 51:1) [Feb. 6, ip-2 p. 165 para. 2]
7. Olee ndị bụ “ọtụtụ ndị” Aịzaya 53:12 kwuru okwu ha, oleekwa ihe na-enye obi ụtọ anyị mụtara banyere Jehova n’otú o si mesoo ha ihe? [Feb. 13, ip-2 p. 213 para. 34]
8. Olee otú e si na-emezu amụma e buru n’Aịzaya 60:17 ná nzukọ Jehova n’oge ikpeazụ a? [Feb. 20, ip-2 p. 316 para. 22]
9. Olee mgbe bụ́ “afọ Jehova na-egosi ihu ọma ya,” bụ́ nke a gwara Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ka ha kwusaa? (Aịza. 61:2) [Feb. 20, ip-2 p. 324-325 para. 7-8]
10. Olee àgwà magburu onwe ya Jehova nwere, nke e kwuru okwu ya n’Aịzaya 63:9? [Feb. 27, w03 7/1 p. 19 para. 22-23]