Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Mach: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịa malitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’ụbọchị mbụ i ziri ha ozi ọma. Eprel na Mee: Ụlọ Nche na Teta! Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ nwere mmasị, nye ya traktị bụ́ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu? Gbalịakwa malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Mgbe ị gara nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, ma hà bụ ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs ma ọ̀ bụkwanụ ndị na-abịa nzukọ anyị ndị ọzọ ma ha anaghị eso eme ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ, gbaa mbọ nye ha akwụkwọ Bible Na-akụzi, gbalịakwa jiri ya malitere ha ọmụmụ Baịbụl. Jun: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Gbalịa malitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’ụbọchị mbụ i ziri ha ozi ọma. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere akwụkwọ Bible Na-akụzi ma ha achọghị ka e duziwere ha ọmụmụ Baịbụl, e nwere ike nye ha magazin ọ bụla merela ochie ma ọ bụkwanụ broshọ ọ bụla ga-amasị ha.
◼ A ga-echeta ọnwụ Jizọs na Tọzdee, Eprel 5, 2012. Ọ bụrụ na e nwere ọgbakọ na-amụ ihe n’ụbọchị Tọzdee, ha kwesịrị iyigharị ọmụmụ ihe nke izu ahụ. Ọ bụrụkwa na ọtụtụ ọgbakọ na-amụ ihe n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze, nke na ọgbakọ na-amụ ihe n’ụbọchị Tọzdee agaghị eyigharịli ọmụmụ ihe ha n’izu ahụ, ha nwere ike ịhapụ ya. Ha nweziri ike gbubilata ihe omume Nzukọ Ije Ozi nke izu ọzọ ma webata nke izu ahụ ma ọ bụrụ na ọ gbasara nnọọ ọgbakọ ha.
◼ E si na Yearbook nke afọ 2012 nweta ihe ndị na-esonụ. Ha ga-abakwara onye ga-ekwu okwu Ncheta Ọnwụ Jizọs uru:
○ Ndị nkwusa e nwere n’ụwa niile dị: 7,659,019
○ Ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs n’ụwa niile dị: 19,374,737
○ N’ụwa niile, ndị tara achịcha ma ṅụọ mmanya e ji cheta ọnwụ Jizọs dị: 11,824
○ Ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs na Naịjirịa dị: 699,406
◼ Isiokwu okwu ihu ọha pụrụ iche a ga-ekwu n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ: “Ọgwụgwụ Ọ̀ Dịla Nso Karịa Otú I Chere?” A ga-ekwu ya ná ngwụcha izu nke izu ahụ a ga-enwe Ncheta Ọnwụ Jizọs.
◼ Ná Nzukọ Ije Ozi a ga-enwe n’ọdịnihu, a ga-atụle vidio abụọ bụ́ Young People Ask—How Can I Make Real Friends? na Young People Ask—What Will I Do With My Life? Ọ bụrụ na e nwere onye chọrọ ha, o kwesịrị isi n’aka ọgbakọ tụọ ọda ha ozugbo.