Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na n’Eprel 2
IZU NA-AMALITE N’EPREL 2
Abụ nke 8 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 18 ¶19-24 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jeremaya 17-21 (Nkeji 10)
Nke 1: Jeremaya 21:1-10 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Olee Ihe Otú Setan Si Achị Merela Ka Anyị Mata? (Nkeji 5)
Nke 3: Alaeze Chineke Ga-amalite Ịrụ Ọrụ Mgbe Ndị Iro Kraịst Ka Na-akpa Ike—td 2B (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ịma ọkwa. Jiri ihe dị n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu” mee ihe ngosi otú e nwere ike isi malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa Eprel.
Nkeji 15: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Otú E Nwere Ike Isi Nye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Eprel. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri otu nkeji ma ọ bụ abụọ kwuo isiokwu ndị ga-amasị ndị bi n’ókèala unu. Gwazie ụmụnna ka ha kwuo ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ na amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 3-8 n’Ụlọ Nche Eprel 1 nye ya magazin ahụ. Ha kwuokwa ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ na amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 3-7 na Teta! Eprel–Jun 2012 nye ya magazin ahụ. Ọ bụrụ na oge ka dị, họrọ isiokwu ọzọ n’Ụlọ Nche ahụ ma ọ bụ na Teta! ahụ ma jụọ ha otu ihe ahụ. Mezie ihe ngosi otú e nwere ike isi nye mmadụ Ụlọ Nche ahụ na Teta! ahụ.
Abụ nke 99 na Ekpere