Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mee 28
IZU NA-AMALITE NA MEE 28
Abụ nke 133 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 21 ¶8-13, igbe dị na p. 169 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jeremaya 49-50 (Nkeji 10)
Nke 1: Jeremaya 49:28-39 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Olee Otú O Si Bụrụ na Aha Jehova Bụ “Ụlọ Elu Siri Ike”?—Ilu 18:10 (Nkeji 5)
Nke 3: Njikọ Alụmdi na Nwunye Aghaghị Ịbụ Ihe Kwesịrị Nsọpụrụ—td 3A (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ịma ọkwa. Jiri ihe dị n’ebe ahụ e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu” mee ihe ngosi otú e nwere ike isi malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa Jun.
Nkeji 25: “Ije Ije n’Okporo Ụzọ Ìhè Na-amụsiwanye Ike na Ya.” Ajụjụ na azịza. Ọ ga-esi n’Ụlọ Nche Febụwarị 15, 2006, p. 26-30, para. nke 13-20. Jiri ihe e kwuru na paragraf nke mbụ n’Ozi Alaeze a mere okwu mmeghe dị nkenke. Jụwazie ndị na-ege ntị ajụjụ paragraf nke 13-20 n’Ụlọ Nche ahụ. Unu tụlechaa, jiri ihe e kwuru na paragraf nke abụọ n’Ozi Alaeze a mere okwu mmechi na-agaghị egbu oge. Gbaa mmadụ niile ume ka ha lee vidio bụ́ “Jehovah’s Witnesses—Faith in Action, Part 2: Let the Light Shine.”
Abụ nke 93 na Ekpere