Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Julaị 9
IZU NA-AMALITE NA JULAỊ 9
Abụ nke 78 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 23 ¶9-15, igbe dị na p. 184, 186 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ezikiel 11-14 (Nkeji 10)
Nke 1: Ezikiel 11:14-25 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: È Kwesịrị Ịkpọ Meri “Nne nke Chukwu”?—td 14A (Nkeji 5)
Nke 3: Gịnị Bụ Ịdị Umeala n’Obi? Oleekwa Otú Ọ Ga-esi Eme Ka Anyị Nwee Olileanya?—Zef. 2:3 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 15: Otú E Si Eme Ka Nletaghachi Na-arụpụta Ihe Dị Mma. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jụọ ndị na-ege ntị ajụjụ ndị a: (1) Mgbe ọ bụla anyị gara nletaghachi na nke mmadụ, gịnị mere o ji dị mma ka anyị nwee ihe anyị bu n’obi anyị na onye ahụ ga-atụle? (2) Olee otú anyị kwesịrị isi kọwaa onwe anyị ma anyị gaa nletaghachi na nke mmadụ? (3) Ọ bụrụ na onye ahụ asị na ya enweghị mmasị, gịnị ka anyị nwere ike ikwu? (4) Ọ bụrụ na anyị nyere mmadụ traktị, broshọ ma ọ bụkwanụ magazin, olee mgbe anyị kwesịrị ịmalite ịmụrụ ya akwụkwọ Bible Na-akụzi? Oleekwa otú anyị ga-esi jiri ya malitere ya ọmụmụ Baịbụl? (5) Ọ bụrụ na anyị anaghị enweta onye anyị chọ aga n’ụlọ, olee otú anyị nwere ike isi mee ka o nwee mmasị ịmụ Baịbụl? (6) Ọ bụrụ na ọ dịbeghị anya onye anyị na ya so gaa nletaghachi ghọrọ onye nkwusa, olee otú anyị nwere ike isi nyere ya aka?
Nkeji 15: “Gịnị Na-eme Ka I Nwee ‘Aṅụrị’?” Ajụjụ na azịza. Mgbe unu na-atụle paragraf nke 4, gbaa mmadụ niile ume ka ha na-enye akụkọ ozi ha n’ọnwa ọ bụla. Kwuo isi ihe ndị dị n’akwụkwọ Ndị A Haziri, peeji nke 88-90.
Abụ nke 9 na Ekpere