Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na n’Ọgọst 27
IZU NA-AMALITE N’ỌGỌST 27
Abụ nke 100 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 25 ¶14-21 (Nkeji 25)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ezikiel 35-38 (Nkeji 10)
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (Nkeji 20)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ịma ọkwa. “Otú A Ga-esizi Na-enwe Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ na Nzukọ Ije Ozi.” Okwu. I kwuchaa, jiri ihe dị n’ebe ahụ e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu” mee ihe ngosi otú e nwere ike isi malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa Septemba.
Nkeji 15: Zie Mmadụ Ozi Ọma Otú Ọ Ga-aghọta Ya. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 226-229. Mee otu ihe ngosi ma ọ bụ ihe ngosi abụọ ga-egosi otú e nwere ike isi mee ihe e kwuru.
Nkeji 10: Gịnị Ka Anyị Mụtara? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gụọnụ Luk 10:1-4, 17. Tụleekwanụ otú amaokwu Baịbụl ndị ahụ ga-esi enyere anyị aka n’ozi ọma.
Abụ nke 57 na Ekpere