Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Ọgọst: Ndị nkwusa nwere ike inye ndị mmadụ nke ọ bụla n’ime broshọ ndị a dị peeji 32: Gee Chineke Ntị, Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke! Gbalịakwa malitere ha ọmụmụ Baịbụl. Ị gaa nletaghachi na nke onye nwere mmasị, jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Ma, ọ bụrụ na ị chọpụta na otu n’ime broshọ ndị a ga-akara onye ahụ mma, jiri ya malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Septemba na Ọktoba: Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị gara nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, gbaa mbọ nye ha akwụkwọ Bible Na-akụzi, gbalịakwa jiri ya malitere ha ọmụmụ Baịbụl. Ma, ọ bụrụ na ị chọpụta na Gee Chineke Ntị ma ọ bụkwanụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi ga-akara ha mma, jiri ya malitere ha ọmụmụ Baịbụl. Nọvemba na Disemba: Jiri traktị ọ bụla unu nwere gaa ozi ọma. Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ egosi mmasị, jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi gosi ya otú anyị si amụrụ ndị mmadụ Baịbụl ma ọ bụkwanụ gị ejiri broshọ bụ́ Gee Chineke Ntị ma ọ bụkwanụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi gosi ya onye ahụ.
◼ Malite n’ọnwa Septemba, isiokwu okwu ihu ọha ndị nlekọta sekit ga na-ekwu ma ha gaa ileta ọgbakọ bụ: “I Soro Chineke Na-eje Ije, Ọ Ga-agọzi Gị Ugbu A, Gọziekwa Gị Ruo Mgbe Ebighị Ebi.”
◼ Otu izu tupu ọgbakọ unu agaa mgbakọ distrikti, unu nwere ike wepụta nkeji ole na ole n’ihe omume Nzukọ Ije Ozi, jiri ya tụlee ihe ndị e kwesịrị iburu n’uche gbasara mgbakọ ahụ unu ga-aga. Otu ọnwa ma ọ bụ ọnwa abụọ unu lọtara mgbakọ, unu nwere ike iji oge e kwesịrị iji tụlee mkpa ọgbakọ tụlee ihe ụfọdụ e kwuru ná mgbakọ ahụ, bụ́ ndị ga-abara ụmụnna uru n’ozi ọma.