Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Septemba 3
IZU NA-AMALITE NA SEPTEMBA 3
Abụ nke 6 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
bt isi nke 26 ¶1-8, igbe dị na p. 204 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ezikiel 39-41 (Nkeji 10)
Nke 1: Ezikiel 40:17-31 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Olee Otú Anya Anyị Nwere Ike Isi Duhie Anyị?—Jen. 3:2-6 (Nkeji 5)
Nke 3: Nwunye Ekwesịghị Ikwe Ka Di Kewapụ Ya n’Ebe Chineke Nọ—td 25B (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Otú Anyị na Ndị Nwe Ụlọ Ga-esi Na-atụgharị Uche—Nkebi nke Abụọ. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ, nke si n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 253, paragraf nke 3, ruo ná ngwụcha peeji nke 254. Jiri nkeji ole na ole mee otu ihe ngosi ma ọ bụ ihe ngosi abụọ ga-egosi otú e nwere ike isi mee ihe e kwuru.
Nkeji 10: Ka Anyị Na-agbarịta Ibe Anyị Ume. (Hib. 10:25) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’Ụlọ Nche Ọgọst 15, 2008, peeji nke 20-21, paragraf nke 15-18. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ha mụtara.
Nkeji 10: Otú E Nwere Ike Isi Nye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Septemba. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri ọkara nkeji ma ọ bụ otu nkeji kwuo isiokwu ụfọdụ ga-amasị ndị bi n’ókèala unu. Gwazie ụmụnna ka ha kwuo ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ na amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 3-11 n’Ụlọ Nche Septemba 1 nye ya magazin ahụ. Ha kwuokwa ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ na amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 3-9 na Teta! Julaị–Septemba nye ya magazin ahụ. Ọ bụrụkwa na oge ka dị, họrọ otu isiokwu ọzọ n’Ụlọ Nche ahụ ma ọ bụ na Teta! ahụ ma jụọ ha otu ihe ahụ. Mezie ihe ngosi otú e nwere ike isi nye mmadụ Ụlọ Nche ahụ na Teta! ahụ.
Abụ nke 34 na Ekpere