Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Ọktoba: Ụlọ Nche na Teta! Mgbe ị gara nletaghachi na nke ndị nwere mmasị, gbaa mbọ nye ha akwụkwọ Bible Na-akụzi, gbalịakwa jiri ya malitere ha ọmụmụ Baịbụl. Ma, ọ bụrụ na ị chọpụta na Gee Chineke Ntị ma ọ bụkwanụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi ga-akara ha mma, jiri ya malitere ha ọmụmụ Baịbụl. Nọvemba na Disemba: Jiri traktị ọ bụla unu nwere gaa ozi ọma. Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ achọọ ka a mụwara ya Baịbụl, jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi gosi ya otú anyị si amụrụ ndị mmadụ Baịbụl ma ọ bụkwanụ gị ejiri broshọ bụ́ Gee Chineke Ntị ma ọ bụkwanụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi. Jenụwarị: Ndị nkwusa nwere ike inye ndị mmadụ nke ọ bụla n’ime broshọ ndị a dị peeji 32: Gee Chineke Ntị, Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi ma ọ bụ Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke! Gbalịakwa malitere ha ọmụmụ Baịbụl. Ị gaa nletaghachi na nke onye nwere mmasị, jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Ma, ọ bụrụ na ị chọpụta na otu n’ime broshọ ndị a ga-akara onye ahụ mma, jiri ya malitere ya ọmụmụ Baịbụl.