Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Nọvemba 5
IZU NA-AMALITE NA NỌVEMBA 5
Abụ nke 115 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 1 ¶1-7 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Joel 1-3 (Nkeji 10)
Nke 1: Joel 2:17-27 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Olee Otú Anyị Nwere Ike Isi Mee Ihe E Kwuru n’Ilu 22:3? (Nkeji 5)
Nke 3: Ọ̀ Dị Njọ Ịkatọ Ozizi Ụgha?—td 36B (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ndị Inyom Na-ezisa Ozi Ọma Bụ Ìgwè Dị Ukwuu. (Ọma 68:11) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’Ụlọ Nche Eprel 15, 2009, igbe dị na peeji nke 22. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ha mụtara.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Otú E Nwere Ike Isi Nye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Nọvemba. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri otu nkeji ma ọ bụkwanụ ọkara nkeji kwuo isiokwu ụfọdụ ga-amasị ndị bi n’ókèala unu. Gwazie ụmụnna ka ha kwuo ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ na amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 3-8 n’Ụlọ Nche Nọvemba 1 nye ya magazin ahụ. Ha kwuokwa ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ na amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 3-9 na Teta! Ọktoba–Disemba nye ya magazin ahụ. Ọ bụrụkwa na oge ka dị, họrọ otu isiokwu ọzọ n’Ụlọ Nche ahụ ma ọ bụ na Teta! ahụ ma jụọ ha otu ihe ahụ. Mezie ihe ngosi otú e nwere ike isi nye mmadụ Ụlọ Nche ahụ na Teta! ahụ.
Abụ nke 105 na Ekpere