Ihe Ise Ga-enyere Anyị Aka Inweta Ndị Anyị na Ha Ga Na-amụ Baịbụl
1. Ọ bụrụ na ọ na-esiri anyị ike inweta ndị anyị na ha ga na-amụ Baịbụl, olee ihe anyị ga-eme? Ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
1 Ọ̀ na-esiri gị ike inweta onye gị na ya ga na-amụ ihe? Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike, adala mbà. Jehova na-agọzi ndị niile na-agbasi mbọ ike ime uche ya. (Gal. 6:9) Ka anyị tụlee ihe ise ga-enyere gị aka inweta ndị gị na ha ga na-amụ Baịbụl.
2. Olee otú ịjụ ndị mmadụ ma hà ga-achọ ka anyị na ha mụwa ihe ga-esi mee ka anyị nweta ndị anyị na ha ga na-amụ Baịbụl?
2 Jụọ Ndị Mmadụ ma Hà Ga-achọ Ka Gị na Ha Mụwa Ihe: Ọtụtụ ndị ma na anyị na-enye ndị mmadụ Ụlọ Nche na Teta! Ma, o nwere ike ịbụ na ha amaghị na anyị na ndị mmadụ nwere ike ịna-amụ Baịbụl. Anyị nọrọ ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ, anyị nwere ike ịjụ ha ma hà ga-achọ ka anyị na ha mụwa ihe. I nwekwara ike ịjụ ndị nwere mmasị n’ihe ị gwara ha mgbe ị nọ ozi ọma ma hà ga-achọ ka gị na ha mụwa ihe. Ọ bụrụ na ha ekweghị, i nwere ike na-ewegara ha akwụkwọ anyị ruo mgbe ha ga-achọ ka gị na ha malite ịmụ ihe. O nwere otu nwanna nwoke nọ na-ewegara otu di na nwunye magazin anyị ruo ọtụtụ afọ. Mgbe o nyechara ha magazin anyị otu ụbọchị tụgharịa ka ọ lawa, otu obi asị ya jụọ ha ma hà ga-achọ ka ha na ya mụwa Baịbụl. Mgbe ọ jụrụ ha, ha kwetara. Nke a tụkwara ya n’anya. Ha na ya malitere ịmụ Baịbụl. E meekwala ha baptizim.
3. Ànyị kwesịrị iche na ndị niile nwere mmasị n’ozi anyị ma na-abịa ọmụmụ ihe anyị nwechara ndị ha na ha na-amụ ihe? Kọwaa.
3 Ndị Na-abịa Ọmụmụ Ihe Anyị: Echekwala na ndị nwere mmasị n’ozi anyị ị na-ahụ n’ọmụmụ ihe anyị nwechara ndị ha na ha na-amụ ihe. Otu nwanna nwoke kwuru, sị: “Ihe karịrị ọkara n’ime ndị mụ na ha na-amụ ihe bụ ndị m hụrụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.” E nwere otu nwaanyị na-emekarị ihere. Nwaanyị ahụ na-abịa ọmụmụ ihe anyị kemgbe afọ iri na ise. Mgbe o ji abịa bụ mgbe a malitechara ọmụmụ ihe. Mgbe o jikwanụ ala bụ ozugbo e kwere amen. Otu ụbọchị, otu nwanna nwaanyị ya na ụmụ nwaanyị ahụ nọ n’ọgbakọ katara obi jụọ ya ma ọ̀ ga-achọ ka ha mụwa Baịbụl, nwaanyị ahụ kwetara. Ka oge na-aga, ọ ghọrọ Onyeàmà Jehova. Nwanna nwaanyị ahụ kwuru, sị: “Ọ na-ewute m na m gbachiri nkịtị ruo afọ iri na ise tupu mụ ajụọ ya ma ọ̀ ga-achọ ka mụ na ya mụwa ihe.”
4. Olee ihe anyị nwere ike ịjụ ndị anyị gara ịmụrụ Baịbụl? Oleekwa ihe anyị nwere ike ịgwa ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ?
4 Jụọ Ndị Mmadụ ma Hà Ma Onye Chọrọ Ka Ya na Onyeàmà Jehova Mụwa Ihe: Otu nwanna nwaanyị na-eso ụmụnna ndị ọzọ aga n’ụlọ ndị ha na ha na-amụ ihe. Ha mụchaa ihe, ya agwa nwanna ahụ ya na ya so ka o cheretụ ka ya jụọ onye ahụ ha bịara na nke ya ma ọ̀ ma onye chọrọ ka ya na Ndịàmà Jehova mụwa ihe. Ọ bụrụ na ị chọrọ inye onye ị na-agakarị na nke ya akwụkwọ Bible Na-akụzi, jụọ ya ma ò nwere onye ọzọ ọ ma ga-achọ ka e nye ya akwụkwọ ahụ. Mgbe ụfọdụ, otú ihe si dịrị ma ndị nkwusa ma ndị ọsụ ụzọ nwere ike ime ka ha na ndị niile ha hụrụ nwere mmasị ghara ịna-amụ ihe. N’ihi ya, gwa ụmụnna ka ha nye gị ndị ahụ nwere mmasị ka gị na ha mụwa ihe.
5. Ọ bụrụ na e nwere nwanna di ya ma ọ bụ nwunye ya na-anọghị n’ọgbakọ, gịnị mere o ji dị mma ka anyị jụọ nwanna ahụ ma ọ̀ ga-achọ ka anyị na di ya ma ọ bụ nwunye ya ahụ mụwa ihe?
5 Ndị Di Ha ma Ọ Bụ Nwunye Ha Na-abụghị Ndịàmà Jehova: Ò nwere ndị nkwusa nọ n’ọgbakọ unu di ha ma ọ bụ nwunye ha na-abụghị Ndịàmà Jehova? Ụfọdụ ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova anaghị ekwe ka di ha ma ọ bụ nwunye ha bụ́ Onyeàmà Jehova na-amụrụ ha ihe. Ma, ha nwere ike kwere ka ha na nwanna ọzọ na-amụ ihe. Ọ ga-aka mma ka onye chọrọ ka ya na ụdị onye ahụ mụwa ihe buru ụzọ gwa di ya ma ọ bụ nwunye ya bụ́ Onyeàmà Jehova ka ọ gwa ya ihe ọ ga-eme.
6. Olee uru ekpere ga-abara anyị mgbe anyị na-achọ onye anyị na ya ga na-amụ ihe?
6 Ekpere Na-akpa Ike: Elegharala ọrụ ekpere na-arụ anya. (Jems 5:16) Jehova kwere anyị nkwa na ya ga-anụ ekpere ọ bụla anyị kpere dị ka uche ya si dị. (1 Jọn 5:14) O nwere otu nwanna nwoke na-anaghị enwe ohere. O kpere ekpere ka Jehova nyere ya aka inweta onye ya na ya ga na-amụ ihe. Nwunye ya nọ na-eche ma di ya ọ̀ ga-enweli ohere ya na mmadụ ga-eji na-amụ ihe, nke ka nke, ma o nweta onye nwere ọtụtụ nsogbu. N’ihi ya, ọ na-etinye nke a n’ekpere mgbe ọ bụla ọ na-ekpe ekpere ka Jehova nyere di ya aka ka o nweta onye ya na ya ga na-amụ ihe. Jehova zara ekpere ha. N’ime ihe dị ka izu abụọ, otu ọsụ ụzọ nọ n’ọgbakọ ha hụrụ onye chọwa onye ga na-amụrụ ya Baịbụl. Ya enyefee ya nwanna ahụ. Nwunye nwanna ahụ kwuru, sị: “M chọrọ ịgwa onye ọ bụla na-eche na ya na mmadụ agaghị amụli ihe ka ọ gwa Jehova mkpa ya n’ekpere. Obi ụtọ mụ na di m nwere ugbu a enweghị atụ n’ihi na Jehova azala ekpere anyị.” Ọ bụrụ na i nwee ndidi, gịnwa ga-enweta onye gị na ya ga na-amụ ihe. Obi ga-adịkwa gị ụtọ na i nyeere mmadụ aka ya ana-aga ije n’okporo ụzọ na-eduba ná ndụ ebighị ebi.—Mat. 7:13, 14.