Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 10/12 p. 5-6
  • Otú Ị Ga-esi Erite Uru n’Ìgwè Ozi Ubi Ị Nọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Ị Ga-esi Erite Uru n’Ìgwè Ozi Ubi Ị Nọ
  • Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nzukọ Ozi Ubi
    Ozi Alaeze Anyi—2009
  • Iduzi Nzukọ Ozi Ubi Otú Ga-enyere Anyị Aka Ikwusa Ozi Ọma nke Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2015
  • Ozi Ìgwè Na-enye Ọṅụ
    Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Otú Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ Si Enyere Anyị Aka
    Ozi Alaeze Anyi—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2012
km 10/12 p. 5-6

Otú Ị Ga-esi Erite Uru n’Ìgwè Ozi Ubi Ị Nọ

1. Olee uru ndị anyị ritere n’ìgwè Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, bụ́ ndị anyị na-eritekwa n’ìgwè ozi ubi?

1 Mgbe a naara enwe Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, ò nwere ihe a na-eme na ya nke ọ na-abụ i cheta ya ugbu a gị asị na a gaara ekwo maka ya hapụ ịkwụsị ya? I chetaranụ na ọ bụ mmadụ ole na ole na-anọ n’Ìgwè Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ nke ọ bụla. Ahụ́ na-erukwa onye ọ bụla n’ime ha ala. Nke a na-eme ka onye ọ bụla na ibe ya dịrị ná mma, bụ́kwanụ ihe na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. (Ilu 18:24) Onye nlekọta ìgwè ọmụmụ akwụkwọ na-amarukwa ndị niile ọ na-elekọta ala. Nke a na-eme ka o nwee ike inyere ha aka ịnọsi ike n’ọgbakọ. (Ilu 27:23; 1 Pita 5:2, 3) Uru ndị a niile anyị ritere n’ìgwè Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ka dịkwa n’ìgwè ozi ubi.

2. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị na ndị anyị na ha nọ n’otu ìgwè ozi ubi nwee ike ịdị ná mma, bụ́kwanụ ihe ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike?

2 Mete Ndị Ọzọ Enyi: Ìgwè ozi ubi na-ahakarị otú ahụ ìgwè ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ na-aha. Ụmụnna ndị nọ n’ìgwè ị nọ nwere ike ịbụ ndị ezigbo enyi gị ma gị na ha na-arụ n’ozi ọma. (Fil. 1:27) Mmadụ ole n’ime ha ka gị na ha rụrụla n’ozi ọma? Ọ ga-adị mma ka ndị gị na ha na-esotụbeghị gaa ozi ọma sorotụ gaa. (2 Kọr. 6:13) Ihe ọzọ anyị nwere ike ime bụ ịgwa onye anyị na ya nọ n’otu ìgwè ozi ubi ka ọ bịa n’ụlọ anyị soro anyị nwee Ofufe Ezinụlọ. Anyị nwekwara ike kpọ ya oriri n’ụlọ anyị. Ihe a na-eme n’ọgbakọ ụfọdụ bụ e nwee nwanna si ọgbakọ ọzọ bịa kwuo okwu n’ọgbakọ ha, otu ìgwè ozi ubi elee ya ọbịa. Ìgwè nke ọ bụla nwe ilekọta nwanna ahụ na-ezukọ n’ụbọchị ahụ ọ bịara kwuoro ha okwu. Ha na-anọ ebe ahụ na-eri na-aṅụ, na-agbarịtakwa ibe ha ume, ya sọkwa ya ya bụrụ na nwanna ahụ agaghị abịa oriri ahụ.

3. Olee otú e si eme ka okwukwe ndị nọ n’ìgwè ozi ubi ọ bụla sikwuo ike?

3 Ọ bụ naanị ugboro abụọ n’izu ka ọgbakọ ọ bụla na-ezukọ amụ ihe ugbu a. Ma, nke a apụtaghị na ndị okenye agaghị na-elekọta ndị nọ n’ọgbakọ ha otú ahụ ha si elekọta ha mgbe anyị na-amụ ihe ugboro atọ n’izu. Ihe mere e ji nwee ndị nlekọta ìgwè ozi ubi bụ ka ha mee ka okwukwe ndị ha na-elekọta sikwuo ike ma nyere ha aka ka ha na-ezi ozi ọma nke ọma. Ọ bụrụ na gị na onye na-elekọta ìgwè ị nọ arụtụbeghị n’ozi ọma, ọ ga-adị mma ma ị gakwuru ya jụọ ya mgbe ọ ga-achọ ka gị na ya rụọ. Onye nlekọta ije ozi na-esokwa ìgwè ozi ubi nke ọ bụla dị n’ọgbakọ ọ nọ aga ozi ọma n’otu ngwụcha izu n’ọnwa ọ bụla. Nke ahụ pụtara na ọ bụrụ na ọgbakọ nwere ìgwè ozi ubi ole na ole, o nwere ike ileta ìgwè nke ọ bụla ugboro abụọ n’afọ. Ị̀ na-ahazi onwe gị ka i soro gaa ozi ọma mgbe ọ bụla ọ ga-abịa ileta ìgwè ị nọ?

4. (a) Olee otú e kwesịrị isi enwe nzukọ ozi ubi? (b) Gịnị mere o ji dị mma ka anyị kwe ka a nọrọ n’ụlọ anyị na-enwe nzukọ ozi ubi?

4 Ọ na-adị mma ma ìgwè nke ọ bụla zụkọọ ná ngwụcha izu gaa ozi ọma n’ókèala ha. Ọ bụrụ na ìgwè ọ bụla anọrọ n’ebe dị ndị nkwusa nọ n’ìgwè ha nso nwee nzukọ ozi ubi, ọ ga-eme ka ọ dịrị ha mfe ịga ya, meekwa ka ha malite ozi ọma n’oge. Nke a na-enye aka eme ka e nye onye nkwusa ọ bụla onye ya na ya ga-arụ, meekwa ka ha gawa ozugbo n’ebe ha ga-ezi ozi ọma. Ọ ga-adịkwara onye na-elekọta ìgwè ozi ubi mfe ilekọta ndị nọ n’ìgwè ya. Ma mgbe ụfọdụ, otú ihe si dị n’ọgbakọ nwere ike ime ka ìgwè abụọ ma ọ bụ karịa na-agakọ ozi ọma ọnụ. Ọ bụrụ na ọgbakọ dum na-aga ozi ọma ìgwè na Satọdee mbụ n’ọnwa ma ọ bụ ma a mụchaa Ụlọ Nche, ọ na-akacha mma ma ndị nọ n’ìgwè nke ọ bụla nọrọ otu ebe. Nke a ga-eme ka ọ dịrị onye na-elekọta ha mfe inye onye ọ bụla onye ya na ya ga-arụ tupu agbasaa nzukọ ozi ubi.—Lee igbe bụ́ “Ì Nwere Ike Ikwe Ka A Nọrọ n’Ụlọ Gị Na-enwe Nzukọ Ozi Ubi?”

5. Gịnị ka Jehova ka na-emere anyị n’agbanyeghị na anyị anaghịzi enwe Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ?

5 Ọ bụ eziokwu na anyị anaghịzi enwe Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ, Jehova ka na-enye anyị ihe niile ga-enyere anyị aka ime uche ya. (Hib. 13:20, 21) O nweghị ihe kọrọ anyị n’ihi na Jehova na-elekọta anyị. (Ọma 23:1) Anyị na-erite ọtụtụ uru n’ìgwè ozi ubi ọ bụla anyị nọ. Ọ bụrụ na anyị ana-emere ndị ọzọ ihe anyị ga-achọ ka ha na-emere anyị ma ‘na-agha mkpụrụ n’ụba,’ anyị “ga-aghọrọ mkpụrụ n’ụba.”​—2 Kọr. 9:6.

[Igbe dị na peeji nke 6]

Ì Nwere Ike Ikwe Ka A Nọrọ n’Ụlọ Gị Na-enwe Nzukọ Ozi Ubi?

N’ọgbakọ ụfọdụ, ìgwè ozi ubi niile na-abịa otu ebe ná ngwụcha izu nwee nzukọ ozi ubi n’ihi na e nweghị ebe ìgwè nke ọ bụla ga-anọ iche nwee nzukọ nke ya. Anyị manụ na nzukọ ozi ubi bụ otu n’ime ọmụmụ ihe ọgbakọ ọ bụla na-enwe. N’ihi ya, onye ọ bụla nke kwere ka a nọrọ n’ụlọ ya na-enwe ya nwere ezigbote ihe ùgwù. Ị̀ ga-ekwe ka a nọrọ n’ụlọ gị na-enwe ya? Echekwala na ụlọ gị adịghị mma ka a nọrọ ya na-enwe nzukọ ozi ubi. Ndị okenye ga-atụle ma ụlọ gị ọ̀ dị ndị nkwusa nso. Ha ga-atụlekwa ihe ndị ọzọ yiri ihe ndị ha tụlere mgbe ha na-atụle ebe ndị a ga-anọ na-enwe Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Ọ bụrụ na ị ga-achọ ka a nọrọ n’ụlọ gị na-enwe nzukọ ozi ubi, gwa onye na-elekọta ìgwè ozi ubi ị nọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya