Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/03 p. 1
  • Ozi Ìgwè Na-enye Ọṅụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ozi Ìgwè Na-enye Ọṅụ
  • Ozi Alaeze Anyi—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Ị Ga-esi Erite Uru n’Ìgwè Ozi Ubi Ị Nọ
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Nzukọ Ozi Ubi
    Ozi Alaeze Anyi—2009
  • Iduzi Nzukọ Ozi Ubi Otú Ga-enyere Anyị Aka Ikwusa Ozi Ọma nke Ọma
    Ozi Alaeze Anyi—2015
  • Ụzọ Dị Iche Iche Anyị Si Ekwusa Ozi Ọma
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2003
km 7/03 p. 1

Ozi Ìgwè Na-enye Ọṅụ

1 Mgbe Jizọs na-ezipụ ndị na-eso ụzọ 70 ịga kwusaa ozi ọma, o nyere ha ntụziaka banyere ihe ha ga-ekwu, kee ha abụọ abụọ, ma gwa ha ókèala ha ga-eje ozi na ya. Nke a so mee ka ha nwee ọṅụ. (Luk 10:1-17) N’otu aka ahụ taa, ozi ìgwè na-enye aka akwadebe, ahazi, ma na-agba ndị Chineke ume maka ọrụ nkwusa ahụ.

2 Ndị Okenye Na-ebute Ụzọ: Ndị okenye na-ekere òkè dị oké mkpa n’inyere mmadụ nile aka ikerechi òkè anya n’ọrụ nkwusa. Onye nlekọta ije ozi na-ebute ụzọ n’ime ndokwa maka ozi etiti izu. Ọ dị onye nlekọta ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ nke ọ bụla n’aka ịhazi ihe omume ahụ n’ìgwè nke ya, karịsịa ná ngwụsị izu. N’oge ndị ọgbakọ nile zukọrọ maka ozi ubi, dị ka mgbe e nwesịrị Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, onye nlekọta ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ nke ọ bụla kwesịrị ịhụ maka mkpa nke ìgwè nke ya.

3 “N’ụzọ Kwesịrị Ekwesị Nakwa Dị Ka Ndokwa Si Dị”: Onye a họpụtara iduzi nzukọ maka ozi ubi kwesịrị ịmalite n’oge ma mee ka nzukọ ahụ ghara ịkarị minit 10 ma ọ bụ 15. Ọ kasị mma ma ọ bụrụ na o kee ìgwè ahụ ma nye ha ókèala (ọ gwụla ma ndị nlekọta ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ hà ga-ahụ maka nke a dị ka e kwuru na mbụ) tupu e mechie n’ekpere. Nke a na-ebelata mkpa ọ dị ndị nkwusa ịgbakọta n’ókèala ahụ, bụ́ nke pụrụ ime ka ọrụ anyị ghara inwechazi ùgwù. O kwekọkwara na ndụmọdụ Pọl bụ́: “Ka ihe nile were ọnọdụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa dị ka ndokwa si dị.” (1 Kọr. 14:40) Ndị nile ga-aga nzukọ a kwesịrị inye aka hụ na ndokwa a gara nke ọma site n’ịbịa n’oge, ikwenyere onye na-eduzi nzukọ ahụ n’ụzọ zuru ezu, na ịgawa n’ókèala a ga-arụ ọrụ na ya n’egbughị oge ozugbo e mechiri nzukọ ahụ.

4 Ndị E Mere Ka Ha Dị n’Otu: Ndokwa maka ozi ìgwè na-emeghere anyị ohere magburu onwe ya ịmata ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ. Ọ bụ ezie na ọ dịghị njọ ibu ụzọ mee ndokwa isoro mmadụ jee ozi, ọ pụkwara ịbara anyị uru ịga nzukọ maka ozi ubi n’ebughị ụzọ mee ndokwa maka ndị anyị na ha ga-arụ. A pụrụ ikenye anyị isoro onye anyị na-amachaghị jee ozi, wee si otú ahụ mee ka anyị nwee ike ‘ịgbasapụ’ n’ịhụnanya anyị.—2 Kọr. 6:11-13.

5 Ozi ìgwè na-agba anyị ume ma na-adọta anyị n’otu dị ka ‘ndị na-arụkọ ọrụ n’eziokwu.’ (3 Jọn 8) Ka anyị na-ekere òkè n’ụzọ zuru ezu na ya!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya