Akụkụ nke 7: Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu
Ikpe Ekpere Mgbe A Na-eduzi Ọmụmụ Ihe
1. (a) N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị iji ekpere na-amalite ma na-emechi ọmụmụ Bible? (b) Olee otú anyị pụrụ isi webata ekpere n’ọmụmụ Bible?
1 Ka ndị a na-eduziri ọmụmụ Bible wee nwee ọganihu ime mmụọ, ngọzi Jehova dị ha oké mkpa. (1 Kọr. 3:6) N’ihi ya, o kwesịrị ekwesị iji ekpere na-amalite ma na-emechi ọmụmụ Bible ndị anyị maliterela. Mgbe ụfọdụ, anyị pụrụ ime nke a n’ọmụmụ ihe mbụ anyị duziiri ndị ma Bible. N’ebe ndị ọzọ nọ, ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ịchọpụta mgbe kwesịrị ekwesị iji ekpere malite ọmụmụ ihe ahụ. Ị pụrụ iji Abụ Ọma 25:4, 5 na 1 Jọn 5:14 nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ịghọta ihe mere o ji kwesị ka unu kpee ekpere, ma jirikwa Jọn 15:16 kọwaara ya mkpa ọ dị ikpegara Jehova ekpere site n’aha Jizọs Kraịst.
2. Ọ bụrụ na nwanna nwoke e mere baptizim ma ọ bụ nke a na-emebeghị baptizim esoro nwanna nwanyị gaa iduzi ọmụmụ Bible, ònye ga-ekpe ekpere?
2 Ònye kwesịrị ikpe ekpere mgbe a na-eduzi ọmụmụ Bible? Ọ bụrụ na nwanna nwoke e mere baptizim esoro nwanna nwanyị gaa iduzi ọmụmụ ihe, ọ bụ nwanna nwoke ahụ ga-ekpe ekpere, ọ bụ ezie na nwanna nwanyị ahụ pụrụ iduzi ọmụmụ ihe ahụ, ma ọ ga-ekpuchi isi ya. (1 Kọr. 11:5, 10) N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na nwoke bụ́ onye nkwusa Alaeze a na-emebeghị baptizim esoro nwanna nwanyị gaa iduzi ọmụmụ ihe, ọ bụ nwanna nwanyị ahụ ga-ekpe ekpere. N’ọnọdụ dị otú ahụ, o kwesịrị ikpuchi isi ya mgbe ọ na-ekpe ekpere nakwa mgbe ọ na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ.
3. Olee ihe ndị anyị kwesịrị itinye n’ekpere mgbe anyị na-eduzi ọmụmụ Bible?
3 Ihe Ndị A Pụrụ Itinye n’Ekpere Ahụ: Ekpere a na-ekpe mgbe a na-eduzi ọmụmụ Bible ekwesịghị ito ogologo, ma e kwesịrị ịkpọ okwu aha na ya. E wezuga ịrịọ Jehova ka ọ gọzie ọmụmụ ihe ahụ na ikele ya maka eziokwu ndị anyị mụtarala, o kwesịrị ekwesị inye Ya otuto dị ka Onye ihe ahụ a na-amụ si n’aka ya. (Aịsa. 54:13) Ekpere anyị pụkwara ịgụnye okwu ndị na-egosi na anyị nwere ezigbo mmasị n’ahụ́ onye ahụ anyị na-eduziri ọmụmụ ihe, nweekwa ekele maka nzukọ Jehova ji na-eme ihe. (1 Tesa. 1:2, 3; 2:7, 8) Anyị ịrịọ Jehova ka ọ gọzie mgbalị onye anyị na-amụrụ ihe na-eme itinye ihe ndị ọ na-amụta n’ọrụ pụrụ inyere ya aka ịhụ mkpa ọ dị ịbụ ‘onye na-eme okwu ahụ.’—Jems 1:22.
4. Olee uru iji ekpere na-amalite ma na-emechi ọmụmụ Bible bara?
4 Uru ekpere bara dị ọtụtụ. Ọ na-eweta ngọzi Chineke. (Luk 11:13) Ọ na-eme ka mkpa ọ dị ịmụsi Okwu Chineke ike pụta ìhè. Ka onye anyị na-amụrụ ihe na-aṅa ntị n’ekpere anyị, ọ na-amụta ikpe ekpere. (Luk 6:40) Ọzọkwa, ekpere onye hụrụ nnọọ Chineke n’anya ma nwee ekele maka àgwà ya ndị na-enweghị atụ ji obi ya kpee pụrụ inyere onye a na-amụrụ ihe aka iso Jehova nwee mmekọrịta chiri anya.