Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 6/00 p. 3
  • Igbe Ajụjụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbe Ajụjụ
  • Ozi Alaeze Anyi—2000
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Akụkụ nke 7: Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu
    Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Chịlie Aka Nke Iguzosi Ike N’ihe Elu n’Ekpere
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Jiri Onyinye I Nwere Ikpe Ekpere Kpọrọ Ihe
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Gịnị Ka Ekpere Gị Na-egosi Banyere Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2000
km 6/00 p. 3

Igbe Ajụjụ

◼ Ònye kwesịrị ikpe ekpere ná nzukọ ọgbakọ?

Ekpere a na-ekpe n’ọgbakọ bụ akụkụ dị mkpa nke ofufe anyị. Idu ndị ọzọ n’ekpere n’ihu Jehova bụ ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa na ibu ọrụ dị ukwuu. N’ihi mkpa ọ dị, ndị okenye kwesịrị iji ezi uche eme ihe mgbe ha na-ekpebi ụmụnna nwoke ruru eru ikpe ekpere ná nzukọ. Ụmụnna nwoke e mere baptism bụ́ ndị na-edu ọgbakọ n’ekpere kwesịrị ịbụ ndị Kraịst bụ́ ndị ozi tozuru okè bụ́ ndị a maara dị ka ndị na-esetịpụ ezi ihe nlereanya na ndị ọgbakọ na-akwanyere ùgwù. Ekpere ha dị nsọ ma dị ùgwù kwesịrị igosi ezi mmekọrịta ha na Jehova Chineke nwere. Isiokwu bụ́, “Iji Obi Dị Umeala Na-edu Ndị Ọzọ n’Ekpere” nke dị ná mbipụta nke Ụlọ Nche November 15 1986, kọwapụtara ụkpụrụ ndị dị mkpa bụ́ ndị ga-akasị enyere ndị na-edu ọgbakọ n’ekpere ihu ọha aka.

Ndị okenye agaghị agwa nwanna nwoke a na-enyo omume ya enyo nke na-ejighị ihe akpọrọ ihe ka o kpee ekpere. E kwesịghị ịhọpụta nwanna nwoke bu iwe n’obi ma ọ bụ onye pụrụ iji ekpere ihu ọha mere ụzọ isi kwupụta nghọtahie ya na ndị ọzọ nwere ka o kpee ekpere. (1 Tim. 2:8) Ọ bụ ezie na nwanna nwoke nọ n’afọ iri na ụma pụrụ ịbụ onye e mere baptism, ndị okenye ga-ekpebi ma ò ruru eru n’ụzọ ime mmụọ idu ọgbakọ n’ekpere.—Ọrụ 16: 1, 2.

Mgbe ụfọdụ ná nzukọ maka ije ozi ubi, ọ pụrụ ịdị mkpa ka nwanna nwanyị e mere baptism kpee ekpere ma ọ bụrụ na e nweghị nwanna nwoke ruru eru nọ n’ebe ahụ idu ìgwè ahụ n’ekpere. O kwesịrị iyi ihe mkpuchi isi kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na o yiri ka nwanna nwoke ruru eru agaghị anọ ya n’otu nzukọ maka ije ozi ubi, ndị okenye kwesịrị ikenye nwanna nwanyị ruru eru iduzi ya.

Ọ bụ onyeisi oche Nzukọ Ihu Ọha na-ekpekarị ekpere mmeghe ya. Otú ọ dị, ná nzukọ ndị ọzọ nke ọgbakọ, mgbe e nwere ihe karịrị ụmụnna nwoke ole na ole ruru eru, a pụrụ ịkpọ onye ọzọ na-abụghị nwanna nwoke na-eduzi nzukọ ahụ ma ọ bụ onye e kenyere ikwu okwu mmechi ikpe ekpere mmeghe ma ọ bụ nke mmechi. Otú o sina dị, e kwesịrị ịgwa nwanna nwoke a kpọrọ ikpe ekpere ná nzukọ ọgbakọ tupu oge eruo ka o wee nwee ike iche echiche ihe ọ ga-ekwu. Mgbe ahụ, ọ pụrụ ikpe ekpere gara were were na nke sitere n’obi bụ́ nke kwesịrị ekwesị maka nzukọ ahụ kpọmkwem.

Ekpere dị otú ahụ ekwesịghị ịdị ogologo. Mgbe nwanna nwoke na-ekpe ekpere ihu ọha, a ga-aghọta ihe ọ na-ekwu karị ma ọ bụrụ na o guzoro ọtọ, ma jiri ụda olu kwesịrị ekwesị na okwu doro anya kpee ekpere ahụ. Nke a ga-eme ka o kwe ndị nile gbakọtaranụ omume ịnụ ekpere ahụ na ịsị “Amen!” sitere n’ala ala obi ná ngwụsị ya.—1 Ihe 16:36; 1 Kọr. 14:16.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya