Igbe Ajụjụ
◼ Ọ bụrụ na anyị guzo n’ọnụ ụzọ na-eduziri mmadụ ọmụmụ Baịbụl, ànyị kwesịrị iji ekpere malite ya?
E nwere ọtụtụ uru ọ na-aba ma anyị jiri ekpere malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl, jirikwa ya mechie ya. Anyị na-arịọ Jehova n’ekpere ka o nye anyị mmụọ nsọ ya ka onye anyị na-amụrụ ihe nwee ike ịghọta ihe anyị chọrọ ịmụ. (Luk 11:13) Anyị kpee ekpere, ọ na-eme ka onye anyị na-amụrụ ihe mata na ihe anyị na ya na-amụ dị ezigbo mkpa, anyị na-ejikwa ohere ahụ akụziri ya otú e si ekpe ekpere. (Luk 6:40) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị na mmadụ amụọ ihe ugboro ole na ole, anyị nwere ike gwa ya ka anyị jiri ekpere na-amalite ma na-emechi ọmụmụ ihe ahụ. Ma, e nwere ọtụtụ ihe onye nkwusa kwesịrị ichebara echiche tupu ya ekpebiwe ma ọ̀ ga-adị mma iji ekpere malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl mgbe o guzo n’ọnụ ụzọ.
Ihe mbụ dị mkpa ọ ga-echebara echiche bụ ụdị ebe e guzo chọọ ịmụ ihe ahụ. Ọ bụrụ na ọ bụchaghị ebe ndị mmadụ ga-ahụ ihe a na-eme, e nwere ike kpee ekpere dị nkenke mgbe a chọrọ ịmalite na mgbe a chọrọ imechi ọmụmụ ihe ahụ. Ma, ọ ga-abụ n’ọmụmụ ihe a na-enwechi anya. Ya bụrụkwanụ na ọ bụghị ebe zotụrụ ezo otú ahụ, nke na onye ọ bụla na-agafe ga-ahụ ihe a na-eme, ma ọ bụkwanụ na onye nwe ụlọ agaghị achọcha ka e guzoro otú ahụ kpee ekpere, ọ ga-aka mma ka a hapụ iji ekpere malite ọmụmụ ihe ahụ ma ọ bụ mechie ya. Ọ bụrụzie na e mechaa nọrọ ebe dị mma, e nwere ike kpee ekpere. Ma à nọ n’ebe dị mma na-amụ ihe ma ọ bụ na a nọghị, e kwesịrị iji ezi uche kpebie ma à ga-eji ekpere amalite ọmụmụ ihe ma ọ bụkwanụ na a gaghị eji.—Gụọ ihe e kwuru n’Ozi Alaeze Anyị nke ọnwa March 2005, peeji nke 4.