Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Nọvemba 12
IZU NA-AMALITE NA NỌVEMBA 12
Abụ nke 66 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 1 ¶8-14 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Emọs 1-9 (Nkeji 10)
Nke 1: Emọs 3:1-15 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ọ Dị Mkpa Mmadụ Ịgbanwe Okpukpe Ya ma Ọ Bụrụ na Ihe Okpukpe ahụ Na-akụzi Abụghị Eziokwu—td 36CH (Nkeji 5)
Nke 3: Olee Uru Ịghọta Ihe E Kwuru n’Abụ Ọma 51:17 Ga-abara Anyị? (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ọ Bụrụ na Onye Nwe Ụlọ Asị, ‘Unu Ekweghị na Jizọs.’ Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jụọ ndị na-ege ntị ajụjụ ndị a: Gịnị mere ndị bi n’ókèala anyị ji ekwu na anyị ekweghị na Jizọs? Olee ajụjụ anyị nwere ike ịjụ ha iji mata ihe mere ha ji ekwu ya? Olee ihe Jizọs kụziri nke nwere ike ịmasị ha? Olee ihe dị n’akwụkwọ Bible Na-akụzi, isi nke 4, bụ́ nke e nwere ike iji zaghachi ha? Gwa ndị nkwusa ka ha gụpụtara onye nwe ụlọ ihe e dere na peeji nke 2 n’Ụlọ Nche, bụ́ ebe e kwuru ihe ndị mere e ji ebipụta magazin ahụ. Jirikwa nkeji ole na ole mee otu ihe ngosi otú e nwere ike isi gwa onye sị na anyị ekweghị na Jizọs okwu.
Nkeji 10: Gịnị Ka Anyị Mụtara? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gụọnụ Mak 1:16-20. Tụleekwanụ otú amaokwu Baịbụl ndị ahụ ga-esi enyere anyị aka n’ozi ọma.
Nkeji 10: “Ịrụsi Ọrụ Ike Na-enye Obi Ụtọ.” Ajụjụ na azịza.
Abụ nke 98 na Ekpere