Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Disemba 10
IZU NA-AMALITE NA DISEMBA 10
Abụ nke 32 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 2 ¶14-19, igbe dị na p. 25 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Zefanaya 1–Hagaị 2 (Nkeji 10)
Nke 1: Hagaị 1:1-13 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ụmụ Mmadụ Agaghị Eji Anya Nkịtị Hụ Nlọghachi Kraịst—td 32A (Nkeji 5)
Nke 3: Inwe Uche nke Kraịst Ga-eme Ka Anyị Ghọtakwuo Ụdị Onye Jehova Bụ—Mat. 11:27 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 15: Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nke Afọ 2013. Okwu onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekwu. Kwusie okwu ike n’ihe ndị ga-akacha abara ọgbakọ unu uru, bụ́ ndị dị n’usoro ihe omume nke afọ 2013. Gbaa mmadụ niile ume ka ha na-eji ihe omume e nyere ha akpọrọ ihe. Gwa ha ka ha na-ekwu ihe ndị ha mụtara n’isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Baịbụl, nakwa ka ha na-eme ihe ndị e ji akwụkwọ Rite Uru kọwaara anyị n’izu ọ bụla.
Nkeji 15: “Chebe Uche Gị.” Ajụjụ na azịza. Gwa ọgbakọ mgbe unu ga-aga mgbakọ sekit ma ọ bụrụ na a gwala unu.
Abụ nke 70 na Ekpere