Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enye ndị mmadụ n’ọnwa Mach na Eprel: Ụlọ Nche na Teta! Ị gaa nletaghachi na nke onye nwere mmasị, jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Ma, ọ bụrụ na ị chọpụta na Gee Chineke Ntị ma ọ bụkwanụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi ga-akara onye ahụ mma, jiri ya malitere ya ọmụmụ Baịbụl. Mee na Jun: Jiri traktị ọ bụla unu nwere gaa ozi ọma. Ọ bụrụ na onye nwe ụlọ achọọ ka a mụwara ya Baịbụl, jiri akwụkwọ Bible Na-akụzi gosi ya otú anyị si amụrụ ndị mmadụ Baịbụl ma ọ bụkwanụ gị ejiri broshọ bụ́ Gee Chineke Ntị ma ọ bụkwanụ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi.
◼ A ga-echeta ọnwụ Jizọs na Tuzdee, Mach 26, 2013. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu na-amụ ihe n’ụbọchị Tuzdee, unu kwesịrị iyigharị ọmụmụ ihe nke izu ahụ. Ọ bụrụkwa na unu agaghị eyigharịli ọmụmụ ihe unu n’izu ahụ, unu nwere ike ịhapụ ya. Onye na-ahaziri òtù ndị okenye ọrụ nweziri ike gbubilata ihe omume Nzukọ Ije Ozi nke izu ọzọ ma webata nke izu ahụ e chetara ọnwụ Jizọs ma ọ bụrụ na ọ gbasara ọgbakọ unu. Ọgbakọ ndị ha na onye nlekọta sekit nọ n’izu ahụ kwesịrị iyigharị ọmụmụ ihe ha ga-enwe na Tuzdee. Ha ga-enwe ya n’ụbọchị ọzọ n’izu ahụ onye nlekọta sekit na-eleta ha.