Ihe I Nwere Ike Ikwu
Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa Eprel
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “Anyị na-agwa ndị agbata obi anyị ka ha na-agụ Baịbụl ha. Ma, ọtụtụ ndị na-ekwu na Baịbụl siri ike nghọta. Ì chere na ọ bụ eziokwu? [Chere ka ọ zaa. Ya kwuchaa, gị asị:] Lee ihe akwụkwọ a kwuru.” Gosi ya azụ Ụlọ Nche Eprel 1. Gị na ya tụleekwa ajụjụ nke mbụ. Gụọkwanụ ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu amaokwu Akwụkwọ Nsọ e dere n’ebe ahụ. Nyekọta ya Ụlọ Nche ahụ na Teta!, gị na ya yiekwa mgbe ọzọ ị ga-abịa ka unu tụlee ajụjụ nke abụọ.
Ụlọ Nche Eprel 1
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “O nweghị onye na-enweghị nsogbu ya na ya na-alụ. Nke a emeela ka ọtụtụ ndị na-echegbu onwe ha n’ihi na ha amaghị ihe chi ga-abọta. Ma, olee ihe i chere na ọ bụ ya mere ndị mmadụ anaghị enwe obi ụtọ taa? [Chere ka ọ zaa. Ya kwuchaa, gị asị:] Baịbụl kwuru na Chineke ga-akwụsị nsogbu ndị anyị na-enwe taa n’oge na-adịghị anya. [Gụọ Mkpughe 21:4.] Akwụkwọ a kwuru ihe Chineke ga-emere anyị n’ọdịnihu nakwa otú anyị ga-esi na-enwe obi ụtọ ugbu a.”
Teta! Mach–Eprel
I kelechaa onye ị bịara na nke ya, gị asị ya: “Obi ga-adị di na nwunye ụtọ ma ọ bụrụ na ha na-ebi n’udo. Ma, ọ bụrụ na ha na-esekarị okwu, ì chere na ha ga-edozili ya ma ha mee ihe Baịbụl kwuru? [Chere ka ọ zaa. Gụọ Ilu 29:11. Kwuzie, sị:] Ọ bụrụ na di na nwunye amalite ise okwu, ọ na-esi ike ha ejiri obiọma gwa ibe ha okwu. Isiokwu dị na peeji nke 4-5 kwuru otú di na nwunwe ga-esi kwụsị ịna-esekarị okwu ma ha mata ihe na-esere ha okwu.”