Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite n’Ọktoba 28, 2013.
1. Gịnị ka inwe “uche nke Kraịst” pụtara? (1 Kọr. 2:16) [Sept. 2, w08 7/15 p. 27 para. 7]
2. Olee otú anyị ga-esi ‘gbaara ịkwa iko ọsọ’? (1 Kọr. 6:18) [Sept. 2, w08 7/15 p. 27 para. 9; w04 2/15 p. 12 para. 9]
3. Ná Ndị Kọrịnt nke mbụ isi iri na anọ amaokwu iri atọ na anọ, Pọl kwuru na ụmụ nwaanyị kwesịrị ịna-agbachi nkịtị n’ọgbakọ. Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara? [Sept. 9, w12 9/1, igbe dị na p. 9]
4. Olee otú ndị okenye ga-esi na-eme ihe ahụ Pọl kwuru ná 2 Ndị Kọrịnt 1:24? [Sept. 16, w13 1/15 p. 27 para. 2-3]
5. Olee otú anyị ga-esi na-eme ihe Baịbụl kwuru ná 2 Ndị Kọrịnt 9:7? [Sept. 23, w09 2/15 p. 13 para. 17]
6. Olee uru ime ihe Pọl kwuru ná Ndị Galeshia 6:4 ga-abara anyị? [Sept. 30, w12 12/15 p. 13 para. 18]
7. Gịnị ka ‘ịnọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ’ pụtara? (Efe. 4:3) [Ọkt. 7, w12 7/15 p. 28 para. 7]
8. Olee otú Pọl si lee ihe ndị ọ hapụrụ anya? (Fil. 3:8) [Ọkt. 14, w12 3/15 p. 27 para. 12]
9. Ndị Tesalonaịka nke mbụ isi ise amaokwu isii kwuru, sị: “Ka anyị ghara ịnọ na-ehi ụra dị ka ndị ọzọ na-ehi.” Gịnị ka ihe amaokwu a kwuru pụtara? [Ọkt. 21, w12 3/15 p. 10 para. 4]
10. Olee otú ọnwụ Jizọs si bụrụ “ihe mgbapụta kwekọrọ ekwekọ”? (1 Tim. 2:6) [Ọkt. 28, w11 6/15 p. 13 para. 11]