Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Ọktoba 28
IZU NA-AMALITE N’ỌKTOBA 28
Abụ nke 31 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jl peeji nke 3 na Isiokwu nke 1 na nke 2 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 1 Timoti 1-6–2 Timoti 1-4 (Nkeji 10)
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (Nkeji 20)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: “Olee Ihe Ị Ga-eme n’Oge Ndị Mmadụ Na-eme Ememme?” Okwu.
Nkeji 10: Mee Ka Ndị Mmadụ Ghọta na Ozi Ọma Anyị Na-ezi Bara Uru. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. O si n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi peeji nke 159. Mee ihe ngosi otú e nwere ike isi zie mmadụ ozi ọma gbasara ihe na-eme n’ókèala unu ma nye ya akwụkwọ Bible Na-akụzi.
Nkeji 15: Ịbịa n’Oge Bara Uru. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. (1) Gịnị gosiri na Jehova na-edebe oge? (Hab. 2:3) (2) Ọ bụrụ na anyị na-abịa ọmụmụ ihe n’oge, na-apụtakwa ozi ọma n’oge, olee otú ọ ga-esi gosi na anyị na-akwanyere Jehova ùgwù nakwa na anyị bu ọdịmma ụmụnna anyị n’obi? (3) Ọ bụrụ na anyị anaghị abịa nzukọ ozi ubi n’oge, olee nsogbu o nwere ike ịkpatara onye na-ahazi ozi ọma nakwa ụmụnna ndị ọzọ? (4) Ọ bụrụ na anyị agwa onye nwere mmasị ma ọ bụ onye anyị na-amụrụ ihe mgbe anyị ga-abịa ịhụ ya, gịnị mere anyị ji kwesị ịga na nke ya n’oge? (Mat. 5:37) (5) Olee ihe ndị ga-enyere anyị aka ka anyị nwee ike ịgaghachi na nke onye anyị ziri ozi ọma mgbe anyị na ya yiri na anyị ga-abịa? Oleekwa ihe ga-enyere anyị aka ịna-abịa ọmụmụ ihe n’oge?
Abụ nke 69 na Ekpere