Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Disemba 9
IZU NA-AMALITE NA DISEMBA 9
Abụ nke 84 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jl Isiokwu nke 17-19 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 1 Jọn 1-5; 2 Jọn 1-13; 3 Jọn 1-14–Jud 1-25 (Nkeji 10)
Nke 1: 1 Jọn 5:1-21 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Olee Otú E Kwesịrị Isi Na-echeta Jizọs Kraịst?—Luk 1:32, 33; Jọn 17:3 (Nkeji 5)
Nke 3: Mmadụ na Ndị Nwụrụ Anwụ Hà Nwere Ike Ikwurịta Okwu?—td 41CH (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 15: Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke nke Afọ 2014. Okwu onye nlekọta ụlọ akwụkwọ ga-ekwu. Kwusie okwu ike n’ihe ndị ga-akacha abara ọgbakọ unu uru, bụ́ ndị dị n’usoro ihe omume nke afọ 2014. Ọ na-abụ “Ọgụgụ Baịbụl” si n’isiakwụkwọ ndị mbụ, dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na o si na Jenesis 1-5, nwanna ga-atụle “Isi Ihe Ndị Sitere n’Ọgụgụ Baịbụl” na-esi n’isiokwu bụ́ “Okwu Jehova Dị Ndụ” enweta ihe ọ ga-ekwu. Gwa ụmụnna na malite ugbu a gawa, agaghịzi e si otú ahụ na-eme ya. Gbaa mmadụ niile ume ka ha gbalịa na-eme ihe omume ọ bụla e nyere ha. Gwa ha ka ha na-ekwu ihe ndị ha mụtara n’isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Baịbụl, nakwa ka ha na-eme ihe ndị e ji akwụkwọ Rite Uru kọwaara anyị n’izu ọ bụla.
Nkeji 15: “A Ga-enye Ndị Mmadụ Akụkọ Alaeze nke 38 n’Ọnwa Jenụwarị.” Ajụjụ na azịza. Nye onye ọ bụla bịara ọmụmụ ihe otu Akụkọ Alaeze nke 38. Gwa onye nlekọta ije ozi ka o kwuo ndokwa e mere ka e nwee ike inye ọtụtụ ndị nọ n’ókèala unu traktị ahụ. Jiri ihe dị n’ebe e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu” mee ihe ngosi otú e nwere ike isi nye mmadụ traktị ahụ.
Abụ nke 60 na Ekpere