Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jenụwarị 6
IZU NA-AMALITE NA JENỤWARỊ 6, 2014
Abụ nke 132 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl p. 3 na isi nke 1, ¶1-9 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 1-5 (Nkeji 10)
Nke 1: Jenesis 4:1-16 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ihe Baịbụl Kwuru Banyere Ndị Mmụọ Ozi Nupụrụ Isi—td 10CH (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Mere Jizọs Ji Bụrụ Onye Ozizi Ukwu—(lr isi nke 1) (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Otú E Nwere Ike Isi Nye Ndị Mmadụ Magazin n’Ọnwa Jenụwarị. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri ọkara nkeji ma ọ bụ otu nkeji kwuo ihe mere magazin ndị ahụ ga-eji amasị ndị bi n’ókèala unu. Gwazie ụmụnna ka ha kwuo ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 3-7 n’Ụlọ Nche Jenụwarị 1 2014 nye ya magazin ahụ. Ha kwuchaa, gị ajụọ ha amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya. Jụọkwa ha ajụjụ ha ga-ajụ mmadụ ma ha chọọ iji isiokwu ndị dị na peeji nke 6-9 na Teta! Jenụwarị—Febụwarị nye ya magazin ahụ. Ha kwuchaa, gị ajụọkwa ha amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ ya. Ọ bụrụkwa na oge ka dị, họrọ otu isiokwu ọzọ n’Ụlọ Nche ahụ ma ọ bụ na Teta! ahụ, jụọkwa ha ajụjụ ndị ahụ ị jụrụ ha mbụ. Mezie ihe ngosi otú e nwere ike isi nye mmadụ Ụlọ Nche ahụ na Teta! ahụ.
Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 10: Gịnị Ka Anyị Mụtara? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gụọnụ 1 Ndị Kọrịnt 9:19-23. Tụleekwanụ otú amaokwu Baịbụl ndị ahụ ga-esi enyere anyị aka n’ozi ọma.
Abụ nke 7 na Ekpere