Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite na Jun 30, 2014.
Gịnị mere anyị ji kwesị iburu ihe dị n’Ọpụpụ 23:2 n’obi mgbe anyị na-achọ ihe anyị ga-eji na-atụrụ ndụ? [Mee 5, w11 7/15 p. 10-11 para. 3-7]
Olee ihe mere o ji bụrụ iwu na ndị nchụàjà ga-asa aka ha na ụkwụ ha tupu ha achụọrọ Jehova àjà? Oleekwa ihe ọ na-echetara ndị na-efe Jehova taa? (Ọpụ. 30:18-21) [Mee 19, w96 7/1 p. 9 para. 9]
Gịnị mere na Jehova ataghị Erọn ahụhụ maka nwa ehi ọlaedo ahụ ọ kpụrụ? (Ọpụ. 32:1-8, 25-35) [Mee 19, w04 3/15 p. 27 para. 4]
Olee ihe Ndị Kraịst chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ịmụta n’iwu Chineke nyere ndị Izrel ka ha ghara ịlụ ndị na-anaghị efe Chineke? (Ọpụ. 34:12-16) [Mee 26, w89 11/1 p. 20-21 para. 11-13]
Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’aka Bezalel na Oholiab? (Ọpụ. 35:30-35) [Mee 26, w10 9/15 p. 10 para. 13]
Gịnị ka “ihe àmà dị nsọ nke nraranye” na-adị n’ákwà nnukwu onye nchụàjà na-eke n’isi na-echetara ya? Gịnịkwa ka ihe àmà ahụ na-akụziri anyị gbasara mmadụ ịrara onwe ya nye Chineke? (Ọpụ. 39:30) [Jun 2, w01 2/1 p. 14 para. 2-3]
Gịnị ka Onye Kraịst kwesịrị ime ma ọ mara na nwanna ya mere mmehie dị oké njọ? (Lev. 5:1) [Jun 9, w97 8/15 p. 27]
Olee uru àjà udo baara ụmụ Izrel n’oge ochie? Oleekwa ihe anyị mụtara na ya? (Lev. 7:31-33) [Jun 16, w12 1/15 p. 19 para. 11-12]
Olee ihe nwere ike ịbụ mmehie Nedab na Abaịhu mere? Oleekwa ihe anyị mụtara n’ihe ahụ mere ha? (Lev. 10:1, 2, 9) [Jun 23, w04 5/15 p. 22 para. 6-8]
Iwu Mozis kwuru na nwaanyị mụrụ nwa ọhụrụ adịghị ọcha. Gịnị mere o ji bụrụ “onye na-adịghị ọcha”? (Lev. 12:2, 5) [Jun 23, w04 5/15 p. 23 para. 2]