Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Septemba 22
IZU NA-AMALITE NA SEPTEMBA 22
Abụ nke 9 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 13 ¶11-18 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ọnụ Ọgụgụ 30-32 (Nkeji 10)
Nke 1: Ọnụ Ọgụgụ 32:16-30 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: A Gụghị Ndị Ga-enweta Ndụ Ebighị Ebi n’Ụwa Ọnụ—td 30CH (Nkeji 5)
Nke 3: Gịnị Ga-eme Anyị ma Anyị Nwụọ?—lr isi nke 34 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 15: Ozi Ala Ọzọ Na-eweta Obi Ụtọ. (Ilu 10:22) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’Akwụkwọ Mgbaafọ nke 2014, peeji nke 123, paragraf nke 2 ruo na peeji nke 127, paragraf nke 3; nakwa peeji nke 169. Gwa ụmụnna ka ha kwuo ihe ha mụtara n’ebe ahụ.
Nkeji 15: “Jiri jw.org Na-ezi Ndị Mmadụ Ozi Ọma.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-eme ihe ngosi otú ahụ paragraf nke 2 kwuru onye nlekọta ahụ si eme. E mechaa ya, jụọ ụmụnna ajụjụ ndị a: Olee uru ọ bara ma anyị tinye fim ahụ n’ekwentị anyị? Gịnị mere o ji dị mma ka anyị ghara ikwu ogologo okwu tupu anyị egosi onye anyị gara na nke ya fim ahụ? Gịnị mere o ji dị mma ka anyị ghara ịjụ onye ahụ ajụ tupu anyị akpọwa ya? Olee ahụmahụ i nwere mgbe i gosiri ya mmadụ n’ozi ọma? Ná mmechi, gbaa ụmụnna ume ka ha na-aga na jw.org/ig nakwa ka ha na-eji ya ezi ndị mmadụ ozi ọma.
Abụ nke 84 na Ekpere