Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Disemba 8
IZU NA-AMALITE NA DISEMBA 8
Abụ nke 6 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 17 ¶1-8 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jọshụa 1-5 (Nkeji 10)
Nke 1: Jọshụa 1:1-18 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ihe Mere E Ji Kpọọ Ezigbo Ndị Kraịst Asị—td 25A (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ka Anyị Na-arụ Ọrụ—lr isi nke 42 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: Si n’ezi akụ̀ e nyere anyị na-ewepụta “ihe ọma.”—Mat. 12:35a.
Nkeji 10: “Ihe Ọma” Ndị Anyị Na-atụ Anya Ha n’Ọnwa A. Okwu. Kọwaa isiokwu ọnwa a. (Mat. 12:35a) Onye kụziiri anyị eziokwu dị na Baịbụl nyere anyị ọtụtụ ihe ọma ndị ọ mụtara. (Gụọ Ụlọ Nche, Eprel 1, 2002, p. 16, para. 5-7.) Anyịnwa kwesịkwara ịkụziri ndị ọzọ “ihe ọma” ndị ahụ. (Gal. 6:6) N’ọnwa a, anyị ga-enweta ọtụtụ “ihe ọma” ná Nzukọ Ije Ozi. Kwuo okwu otú ga-eme ka ụmụnna na-atụsi anya “ihe ọma” ndị ahụ ike. A ga-enyere anyị aka ịmụtakwu otú anyị ga-esi na-akụzi ihe nke ọma nakwa otú anyị ga-esi mụta abụ ndị ọhụrụ.
Nkeji 20: “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Iji Akwụkwọ Bible Na-akụzi Egosi Otú Anyị Si Amụrụ Ndị Mmadụ Baịbụl.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Onye nkwusa bụ́ aka ochie ma ọ bụ onye ọsụ ụzọ ga-eme ihe ngosi ebe ọ na-egosi mmadụ otú anyị na ndị mmadụ si eji akwụkwọ Bible Na-akụzi amụ Baịbụl.
Abụ nke 96 na Ekpere