Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Disemba 15
IZU NA-AMALITE NA DISEMBA 15
Abụ nke 1 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 17 ¶9-16 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jọshụa 6-8 (Nkeji 10)
Nke 1: Jọshụa 8:18-29 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Nwunye Ekwesịghị Ikwe Ka Di Ya Kewapụ Ya n’Ebe Chineke Nọ—td 25B (Nkeji 5)
Nke 3: Olee Ndị Bụ Ụmụnne Anyị?—lr isi nke 43 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: Si n’ezi akụ̀ e nyere anyị na-ewepụta “ihe ọma.”—Mat. 12:35a.
Nkeji 15: “Ịmụrụ Ndị Mmadụ Baịbụl Otú Ọ Ga-eru Ha n’Obi.” Ajụjụ na azịza. Unu tụlechaa paragraf nke 3, a ga-eme ihe ngosi abụọ. Ọ ga-abụ ebe onye nkwusa na onye ọ na-amụrụ ihe na-atụle paragraf nke 8 n’isiokwu nke 15 n’akwụkwọ Bible Na-akụzi. Na nke mbụ, ọ ga-abụ naanị onye nkwusa ahụ ga-ekwu okwu, kọwaa paragraf ahụ naanị ya. Ma na nke abụọ, ọ ga na-ajụ onye ọ na-amụrụ ihe ajụjụ ka o wee mara ihe dị ya n’obi.
Nkeji 15: Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịkwado Otú Ị Ga-esi Mụọrọ Mmadụ Baịbụl. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ ga-esi n’ebe e dere “Gịnị Ka Baịbụl Na-akụzi?” nke dị na jw.org/ig. (Ị gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI pịa ebe e dere NDỊ NA-ETO ETO.) Tụleenụ otú e nwere ike isi jiri ihe dị n’ebe ahụ mụọrọ mmadụ Baịbụl, ya eruo ya n’obi. Olee otú ajụjụ ndị dị n’isiokwu nke ọ bụla ga-esi nyere anyị aka ịkụziri mmadụ ihe ka o ruo ya n’obi? A ga-eme ihe ngosi ebe nwanna na-agwa onwe ya okwu. Ọ ga-eji otu n’ime isiokwu ndị dị ebe ahụ kwadebe otú ọ ga-esi nyere onye ọ na-amụrụ ihe aka. Ọ ga-echepụtakwa ajụjụ ndị ọ ga-ajụ ya ka o nwee ike ikwu ihe dị ya n’obi. Ná mmechi, gbaa ụmụnna ume ka ha gbalịa na-eji “ihe ọma” ndị anyị nwere na-akụziri ndị ha na-amụrụ Baịbụl ihe otú ọ ga-eru ha n’obi. Ime otú ahụ ga-eme ka ha bụrụ ezigbo ndị nkụzi.—Ilu 20:5.
Abụ nke 99 na Ekpere