Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Disemba 22
IZU NA-AMALITE NA DISEMBA 22
Abụ nke 15 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 17 ¶17-23, igbe dị na peeji nke 177 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jọshụa 9-11 (Nkeji 10)
Nke 1: Jọshụa 9:16-27 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Di Ekwesịghị Ikwe Ka Nwunye Ya Gbochie Ya Ife Chineke—td 25CH (Nkeji 5)
Nke 3: Ndị Enyi Anyị Kwesịrị Ịhụ Chineke n’Anya—lr isi nke 44 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: Si n’ezi akụ̀ e nyere anyị na-ewepụta “ihe ọma.”—Mat. 12:35a.
Nkeji 5: Mkpa ọgbakọ.
Nkeji 25: “Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi nke Afọ 2015 Ga-enyere Anyị Aka Ịna-ezi Ihe nke Ọma.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ bụ onye nlekọta Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi ga-eme ya. O nwere ike ikpebi ka a gụpụta paragraf ụfọdụ tupu a tụlee ha. Ọ ga-ekwu mgbanwe e mere n’otú a ga-esizi na-eme ihe omume nke mbụ, otú e si hazigharịa oge a ga-eji na-atụle isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Baịbụl nakwa otú onye nlekọta Ụlọ Akwụkwọ ga-esizi na-enye ndụmọdụ. A ga-agụ paragraf nke 7, tụlee ya. A tụlechaa ya, a ga-eme ihe ngosi ebe okenye na nwunye ya na nwa ha na-enwe ofufe ezinụlọ. Ọ ga-eji isiokwu dị na peeji nke 14 n’akwụkwọ bụ́ Ihe Baịbụl Na-ekwu duzie ya. Gbaa mmadụ niile ume ka ha gbaa mbọ na-eme ihe ndị ha ga-amụta n’ụlọ akwụkwọ a. Gbaakwa ha ume ka ha na-agụ akwụkwọ bụ́ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, jirikwa ya na-abịa ọmụmụ ihe.
Abụ nke 117 na Ekpere