Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Disemba 29
IZU NA-AMALITE NA DISEMBA 29
Abụ nke 37 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 18 ¶1-8 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jọshụa 12-15 (Nkeji 10)
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (Nkeji 10)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: Si n’ezi akụ̀ e nyere anyị na-ewepụta “ihe ọma.”—Mat. 12:35a.
Nkeji 20: Jiri nke Nta nke Nta Na-akụziri Ndị Ị Na-amụrụ Ihe na Ụmụaka Ndịàmà Jehova “Ihe Ọma.” (Mat. 12:35a) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jiri amaokwu Baịbụl ndị a kọwaa ihe anyị kwesịrị ịtụ anya n’aka ndị anyị na-amụrụ ihe na ụmụaka anyị ndị anyị na-amụrụ ihe: 1 Ndị Kọrịnt 13:11; 1 Pita 2:2, 3. Kọwaa ihe ‘idetụ’ ‘mmiri ara nke dị n’okwu Chineke’ ire pụtara nakwa otú anyị ga-esi nyere ndị anyị na-amụrụ ihe na ụmụ anyị aka ime otú ahụ. Kọwaakwa ihe anyị mụtara na Mak 4:28. (Gụọ Ụlọ Nche, Disemba 15, 2014, p. 12, para. 6-8.) Gbaa onye nkwusa bụ́ aka ochie ma ọ bụ nne ma ọ bụ nna ajụjụ ọnụ ka o kwuo otú o si nyere onye ọ na-amụrụ ihe ma ọ bụ nwa ya aka, ya ana-enwe ọganihu n’ọgbakọ.—Efe. 4:13-15; gụọ Igbe Ajụjụ dị n’Ozi Alaeze Anyị nke Mee 2014.
Nkeji 10: “Na-ele Ndị Ọzọ Ọbịa Ka Ha Nweta ‘Ihe Ọma’ (Mat. 12:35a).” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Olee uru ụfọdụ ndị riterela ma ọ bụkwanụ ahụmahụ ụfọdụ nwerela n’ihi na ha lere ndị ọzọ ọbịa? Gwa ụmụnna ka ha kwuo ụzọ dị iche iche anyị ga-esi na-ele ndị ọzọ ọbịa, karịchaa ndị na-eje ozi oge niile. Kwuo ndokwa unu mere banyere otú unu ga-esi na-ele ụmụnna bịara ikwu okwu n’ọgbakọ unu ọbịa.
Abụ nke 124 na Ekpere