Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jenụwarị 12
IZU NA-AMALITE NA JENỤWARỊ 12
Abụ nke 114 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 18 ¶20-24, igbe dị na peeji nke 188 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jọshụa 21-24 (Nkeji 8)
Nke 1: Jọshụa 24:14-21 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Gịnị Ka Anyị Ga-amụta n’Aka Meri Nne Jizọs? (Nkeji 5)
Nke 3: Jehova Bụ Onye Okike Kacha Ike—igw p. 2 ¶4–p. 3 ¶1 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: ‘Jiri Obi Umeala Na-agbara Onyenwe Anyị Ohu.’—Ọrụ 20:19.
Nkeji 10: Jiri Obi Umeala Na-agbara Onyenwe Anyị Ohu. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Gụọnụ Ọrụ Ndịozi 20:19. A gụchaa ya, jụọ ndị na-ege ntị ajụjụ ndị a: (1) Gịnị ka ịgba ohu e kwuru okwu ya ebe a pụtara? (2) Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi na-agbara Onyenwe anyị ohu? (3) Gịnị bụ ịdị nwayọọ n’obi? (4) Olee otú ịdị nwayọọ n’obi ga-esi nyere anyị aka n’ozi anyị?
Nkeji 20: “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu nke Ọma n’Ozi Ọma—Ihe Anyị Ga-eme ma Ọ Bụrụ na A Nabataghị Anyị.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Unu tụlechaa isokwu a, a ga-eme ihe ngosi abụọ na-agaghị egbu oge. Nke mbụ ga-abụ ebe onye nkwusa ji iwe na-agwa onye ọ bịara na nke ya na-anabataghị ya okwu. Ma na nke abụọ, a ga-egosi ebe onye nkwusa ahụ medara obi jiri akọ gwa ya okwu. Gbaa mmadụ niile ume ka ha mee ihe dị n’ebe ahụ e dere “Mee Ihe A n’Ọnwa A.”
Abụ nke 76 na Ekpere