Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
A ga-aza ajụjụ ndị e dere ebe a n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu na-amalite na Disemba 28, 2015. Ụbọchị e denyere n’akara ngebichi bụ izu a ga-eme ihe omume e si na ya nweta ajụjụ ahụ. E denyere ya ka i nwee ike mee nchọnchọ n’izu ahụ a ga-amụ ya.
Ihe ụfọdụ ndị na-ekwu ma ha gụchaa 1 Ihe E Mere 20:3, bụ na obi tara Devid mmiri maka otú o si mesoo ndị ọ dọọrọ n’agha. Ihe a ha na-ekwu ọ̀ bụ eziokwu? [Nọv. 2, w05 2/15 p. 27]
Gịnị mere Devid ji weta ọtụtụ n’ime ihe ndị e ji rụọ ụlọ nsọ Jeruselem? Gịnịkwa ga-enyere anyị aka ime ka ya? (1 Ihe 22:5) [Nọv. 9, w05 10/1 p. 11 para. 7]
Devid gwara Sọlọmọn, sị: “Mara Chineke nke nna gị.” (1 Ihe 28:9) Gịnị ka ihe a ọ gwara ya pụtara? [Nọv. 16, w10 11/1 p. 30 para. 3, 7]
Gịnị ka arịrịọ Sọlọmọn rịọrọ Jehova nke dị na 2 Ihe E Mere 1:10, gosiri gbasara Sọlọmọn? Gịnịkwa ka anyị mụtara na ya? (2 Ihe 1:11, 12) [Nọv. 23, w05 12/1 p. 19 para. 6]
Gịnị ka 2 Ihe E Mere 6:29, 30 kwuru nke ọ bụ naanị Jehova nwere ike ịma? Gịnịkwa mere anyị ga-eji na-agwa ya otú obi dị anyị n’ekpere? (Ọma 55:22) [Nọv. 30, w10 12/1 p. 11 para. 7]
Olee ihe mere Esa ji rịọ Jehova ka o nyere ha aka ka ha merie ọtụtụ ndị agha bịara ịlụso ha agha? Oleekwa ihe mere anyị kwesịrị iji nwee obi ike n’ofufe anyị na-efe Jehova? (2 Ihe 14:11) [Dis. 7, w12 8/15 p. 8 para. 6–p. 9 para. 1]
Olee otú ihe Jehova mere mgbe Eze Jehọshafat mere mmehie si egosi anyị na Jehova hụrụ anyị n’anya? Oleekwa ihe anyị mụtara na ya? (2 Ihe 19:3) [Dis. 14, w03 7/1 p. 17 para. 13; cl p. 245 para. 12]
Gịnị mere anyị ji kwesị ‘ịnọ ebe anyị kwesịrị ịnọ’ ma ‘guzoro otu ebe’? Oleekwa otú anyị ga-esi mee ihe abụọ a? (2 Ihe 20:17) [Dis. 21, w05 12/1 p. 21 para. 2; w03 6/1 p. 21 para. 15-16]
Gịnị ka 2 Ihe E Mere 21:20 na-echetara anyị gbasara ọnwụ Jehoram? [Dis. 21, w98 11/15 p. 32 para. 4]
Olee onye 2 Ihe E Mere 26:5 kwuru na ọ bụ ya kụziiri Ọzaya ịtụ egwu Jehova mgbe ọ ka na-eto eto? Oleekwa otú ndị na-eto eto ga-esi mụta ihe n’aka ndị torola eto nọ n’ọgbakọ? [Dis. 28, w07 12/15 p. 10 para. 2, 4]