Febụwarị 1-7
NEHEMAYA 1-4
Abụ nke 126 na Ekpere
Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE
“Nehemaya Ji Ofufe Chineke Kpọrọ Ihe”: (Nkeji 10)
[Kpọnye vidio bụ́ Ihe Akwụkwọ Nehemaya Na-ekwu.]
Nehe. 1:11–2:3—Nehemaya nwere ezigbo ọṅụ n’ihi ọganihu a nọ na-enwe n’ofufe Chineke (w06 2/1 9 ¶7)
Nehe. 4:14—Otú Nehemaya si tụkwasị Chineke obi nyeere ya aka imeri ndị na-emegide ndị na-efe Chineke (w06 2/1 10 ¶3)
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)
Nehe. 1:1; 2:1—Olee otú o si bụrụ na anyị nwere ike ikwu na ọ bụ otu ebe ka e si gụwa ‘afọ nke iri abụọ’ ahụ e kwuru okwu ya na Nehemaya 1:1 na 2:1? (w06 2/1 8 ¶5)
Nehe. 4:17, 18—Olee otú mmadụ ga-esi jiri naanị otu aka na-ewughachi mgbidi? (w06 2/1 9 ¶1)
Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova?
Olee ihe ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a nke ị ga-eji zie ndị mmadụ ozi ọma?
Ọgụgụ Baịbụl: Nehe. 3:1-14 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA
Otú Anyị Ga-esi Zie Ndị Mmadụ Ozi Ọma n’Ọnwa A: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-ebu ụzọ kpọnye vidio nke ọ bụla iji gosi otú anyị ga-esi ezi ndị mmadụ ozi ọma. E kirichaa nke ọ bụla, a tụlee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ dị na ya nakwa otú onye nkwusa e gosiri na ya si kwulite ihe ya na onye o ziri ozi ọma ga-atụle n’oge ọzọ. Gbaa ụmụnna ume ka ha dee otú ọzọ ha nwere ike isi zie mmadụ ozi ọma.
OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Kwadebe Maka Ịsụ Ụzọ Inyeaka n’Ọnwa Mach ma Ọ Bụ n’Ọnwa Eprel: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-atụle ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ dị́ n’isiokwu bụ́ “Ihe Ga-eme Ka Obi Dịkwuo Anyị Ụtọ n’Oge A Na-echeta Ọnwụ Jizọs.” (km 2/14 2) Chetara ụmụnna ihe mere anyị ji kwesị ịhazi oge anyị tupu ọnwa Mach na Eprel eruo. (Ilu 21:5) A ga-agba ndị nkwusa abụọ ajụjụ ọnụ. Ha ga-abụ ndị sụrụ ụzọ inyeaka n’oge gara aga. Olee nsogbu ndị ha meriri tupu ha enwee ike ịsụ ụzọ? Olee ihe ndị mere ha obi ụtọ n’oge ahụ?
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: ia isi nke 8 ¶1-16 (Nkeji 30)
Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)
Abụ nke 135 na Ekpere