Ebe ụmụnna nwaanyị abụọ ji Gee Chineke Ntị na-ezi ozi ọma n’Indoneshia
Ihe I Nwere Ike Ikwu
TETA!
Ajụjụ: Gịnị ka i chere ga-eme okpukpe ụgha n’ọdịnihu?
Amaokwu Baịbụl: Mkpu. 18:8
Otú a ga-esi enye ya: Isiokwu a ga-akọwakwuru gị gbasara ihe a Baịbụl kwuru. [Gosi ya isiokwu dị na peeji nke 3-6.]
TETA!
Ajụjụ: Gịnị ka i chere ga-enyere ezinụlọ aka ịna-ebi n’udo?
Amaokwu Baịbụl: Kọl. 3:13
Otú a ga-esi enye ya: Isiokwu a ga-akọwakwuru gị ihe ndị ọzọ ga-enyere ezinụlọ aka ịna-ebi n’udo. [Gosi ya isiokwu dị na peeji nke 12-13.]
GEE CHINEKE NTỊ
Ajụjụ: Ọ̀ ga-amasị gị ibi n’ụwa mara mma ka nke a e sere ebe a? [Gosi ya peeji nke 2-3, gị echere ka ọ zaa.]
Amaokwu Baịbụl: Jere. 29:11
Otú a ga-esi enye ya: Akwụkwọ a kwuru otú anyị ga-esi gee Chineke ntị ka anyị nwee ike inweta ihe ọma ndị o kwuru na ya ga-emere anyị n’ọdịnihu. [Tụleenụ peeji nke 4-5.]
DEE OTÚ ỌZỌ Ị GA-ESI JIRI OTU N’IME AKWỤKWỌ NDỊ A ZIE OZI ỌMA
Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.