Ebe ndị nkwusa abụọ ji broshọ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke na-ezi ozi ọma n’Azebaịjan
Ihe I Nwere Ike Ikwu
TETA!
Ajụjụ: Olee otú anyị ga-esi jiri oge anyị na-eme ihe bara uru?
Amaokwu Baịbụl: Ekli. 4:6
Akwụkwọ: Teta! a kwuru ihe ndị ga-enyere anyị aka ịma ihe ndị ka mkpa anyị ga-eji oge anyị na-eme.
NA-AKỤZI EZIOKWU
Ajụjụ: Gịnị ka Chineke bu n’obi kee anyị?
Amaokwu Baịbụl: Ọma 37:29
Eziokwu: Chineke kere anyị ka anyị dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa.
OZI ỌMA SI N’AKA CHINEKE!
Ajụjụ: Olee ebe i chere anyị ga-esi nweta ozi ga-eme anyị obi ụtọ? [Gosi ya vidio bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịnụ Ozi Ọma?]
Amaokwu Baịbụl: Aịza. 52:7
Akwụkwọ: Broshọ a nwere ozi ndị ga-eme gị obi ụtọ si na Baịbụl.
DEE OTÚ Ị GA-ESI EME NKE GỊ
Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.