Ebe ụmụnna na-enye mmadụ broshọ Obi Ụtọ na Jọjịa
Ihe I Nwere Ike Ikwu
ỤLỌ NCHE
Ajụjụ: Olee onye kacha enye onyinye ma n’eluigwe ma n’ụwa?
Amaokwu Baịbụl: Jems 1:17
Akwụkwọ: Ụlọ Nche a kwuru otú anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ maka otu onyinye kacha onyinye niile Chineke nyere anyị.
NA-AKỤZI EZIOKWU
UNU GA-ENWELI OBI ỤTỌ N’EZINỤLỌ UNU
Ihe i nwere ike ikwu: Anyị na-egosi ndị mmadụ vidio a kwuru gbasara ezinụlọ. [Kpọnyere ya vidio e ji enye mmadụ broshọ bụ́ Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu.]
Akwụkwọ: Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịgụ broshọ ahụ e kwuru gbasara ya na vidio a, enwere m ike inye gị ya, ma ọ bụ mụ egosi gị otú ị ga-esi danloduo ya na jw.org/ig.
DEE OTÚ Ị GA-ESI EME NKE GỊ
Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.