OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ndụ Kacha Mma Mmadụ Nwere Ike Ibi
O nwere ọtụtụ ụzọ ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ Jehova nwere ike isi jeere ya ozi. Kirie vidio bụ́ Ndụ Kacha Mma Mmadụ Nwere Ike Ibi ka ị hụ otú otu nwa agbọghọ aha ya bụ Cameron si jiri oge ya jeere Jehova ozi. I kirichaa vidio a, zaa ajụjụ ndị a dị́ ebe a. (Ị gaa na jw.org/ig, pịa ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI, pịa NDỊ NA-ETO ETO ka ị hụ vidio a.)
Gịnị kacha Cameron mkpa ná ndụ ya?
Olee mgbe o kpebiri ijekwuru Jehova ozi? Oleekwa otú o si mee ya?
Olee otú o si kwadebe maka ịkwaga obodo ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma?
Olee ihe ndị nyere Cameron nsogbu n’ebe ahụ ọ gara izi ozi ọma?
Olee uru dị́ na mmadụ ịga jeere Jehova ozi n’obodo ọzọ ma ọ bụkwanụ n’ebe ọzọ ọ na-anọtụbeghị?
Olee uru ozi ahụ Cameron nọ na-aga baara ya?
Gịnị mere mmadụ iji ndụ ya jeere Jehova ozi ji bụrụ ụdị ndụ kacha mma onye ahụ nwere ike ibi?
Olee ụzọ ndị ọzọ ndị na-eto eto nwere ike isi jekwuoro Jehova ozi?