OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Nyere Ụmụ Gị Aka Inwe Okwukwe Siri Ike n’Ebe Onye Okike Nọ
Ihe ndị e kere eke na-akọsa ebube Chineke. (Ọma 19:1-4; 139:14) Ma, ụwa Ekwensu a anyị bi na ya na-akụziri ndị mmadụ ihe ndị na-abụghị eziokwu banyere otú ndụ si bido. (Rom 1:18-25) Olee otú ị ga-esi mee ka ụdị nkụzi ndị a ghara ịgbanye mgbọrọgwụ n’obi ụmụ gị? Bido mgbe ha dị ntakịrị mee ka ha ghọta na Jehova dị adị, nakwa na ihe banyere ha na-emetụ ya n’obi. (2 Kọr. 10:4, 5; Efe. 6:16) Gbalịa mata ihe ha chere gbasara ihe a na-akụziri ha n’ụlọ akwụkwọ. Jirikwa ihe dị iche iche ọgbakọ Jehova na-emepụta kụziere ha nke bụ́ eziokwu.—Ilu 20:5; Jems 1:19.
LEENỤ VIDIO BỤ́ IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU—IKWERE NA CHINEKE. ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Olee ihe ndị na-abụghị eziokwu ndị mmadụ kweere banyere Chineke?
Gịnị ka a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ unu?
Gịnị mere i ji kweta na Jehova dị adị?
Olee otú ị ga-esi nyere mmadụ aka ikweta na ọ bụ Chineke kere ihe niile?