Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp20 nke 3 p. 13
  • Ihe Chineke Ga-emere Ndị Na-enyere Ndị Nọ ná Mkpa Aka

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Chineke Ga-emere Ndị Na-enyere Ndị Nọ ná Mkpa Aka
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE AKWỤKWỌ NSỌ KWURU
  • IHE INYERE MMADỤ AKA PỤTARA
  • Ị̀ Na-anabata Enyemaka Jehova?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Gịnị Ga-akwụsị Ịkpọasị n’Etiti Agbụrụ Dị Iche Iche?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ị̀ Bụ “Ọgaranya n’Ebe Chineke Nọ”?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ọdịnihu Dị Aṅaa Dịịrị Atụrụ na Ụmụ Ewu Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2020
wp20 nke 3 p. 13
Ebe otu nwoke ji map na-egosi nwoke ọzọ ụzọ.

Ì nwere ike inyere ndị ọzọ aka n’agbanyeghị afọ ndụ ha, obodo ha si na okpukpe ha na-ekpe?

Ihe Chineke Ga-emere Ndị Na-enyere Ndị Nọ ná Mkpa Aka

Ọtụtụ ndị n’ụwa a chọsiri nri na ebe obibi ike. E nwekwara ndị nke e kwesịrị ime ka ha nwee olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Olee otú mbọ anyị na-agba iji nyere ndị dị otú ahụ aka ga-esi eme ka ihe anyị dị Chineke mma, ya agọziekwa anyị?

IHE AKWỤKWỌ NSỌ KWURU

“Onye na-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya amara na-agbazinye Jehova ihe, Ọ ga-akwụkwa onye ahụ ụgwọ ihe o mere.”​—ILU 19:17.

IHE INYERE MMADỤ AKA PỤTARA

Jizọs mere ihe atụ gbasara otu nwoke ndị ohi kụrụ ezigbo ihe ma hapụ ya chee na ọ nwụọla. (Luk 10:​29-37) Otu nwoke si obodo ọzọ hụrụ nwoke a e merụrụ ahụ́, ya akwụsị ma nyere ya aka. O nyeere nwoke a aka n’agbanyeghị na ọ bụ onye obodo ọzọ.

Nwoke obiọma ahụ, kechiri ọnyá ya, nyekwa ihe ndị a ga-eji na-elekọta ya. Ihe ọzọ o mere bụ na ọ kasiri ya obi ma mee ka o nweta onwe ya.

Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe atụ ahụ Jizọs mere? Jizọs ji ihe atụ ahụ na-akụziri anyị na anyị kwesịrị ime ihe ọ bụla anyị nwere ike ime iji nyere ndị nọ ná mkpa aka. (Ilu 14:31) Akwụkwọ Nsọ kwuru na n’oge na-adịghị anya, Chineke ga-eme ka ahụhụ ndị mmadụ na-ata kwụsị, meekwa ka ndị mmadụ gharazie ịda ogbenye. Ma, anyị nwere ike ịna-eche otú Chineke ga-esi mee ya na mgbe ọ ga-eme ya. Isiokwu na-esonụ ga-atụle ihe ọma ndị Onye kere gị ga-emere gị n’ọdịnihụ.

Ọ DỊBEGHỊ MGBE CHINEKE HAPỤRỤ M

Ihe onye si Gambia kwaga na Yurop kọrọ

“Mgbe m kwatara na Yurop, enweghị m ihe ọ bụla, ma ọrụ, ma ego ma ebe m ga-ebi. Ihe ndị m mụtara n’Akwụkwọ Nsọ nyeere m aka ịmata otú m ga-esi na-edi nsogbu m, ịna-arụsị ọrụ ike, na ịna-enyere ndị ọzọ aka, kama ịna-arịọ ndị ọzọ ka ha na-enyere m aka. Ọ dịbeghị mgbe Chineke hapụrụ m, ọ na-enyekwara m aka.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya