OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
I Nwere Ike Inyere Ndị Na-adịkwaghị Eje Ozi Aka
Na Tuzdee, Eprel 11, ọtụtụ ndị na-adịkwaghị eje ozi ga-abịa Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ha malitere ịgba ọsọ ndụ, ma n’ihi otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ, ha anaghịzi agbasi ọsọ ike. E kwuru banyere ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ na broshọ Lọghachikwute Jehova. (Hib. 12:1) Ma, Jehova ka ji ndị a na-adịghị ejekwa ozi kpọrọ ihe n’ihi na ha so ná ndị o ji ọbara Ọkpara ya zụta. (Ọrụ 20:28; 1 Pita 1:18, 19) Olee otú anyị ga-esi nyere ha aka ịlọghachi n’ọgbakọ?
Ndị Okenye ọgbakọ na-agbalị ike ha ịchọ ndị na-adịkwaghị eje ozi iji nyere ha aka otú ahụ onye ọzụzụ atụrụ sị agba mbọ na-achọ atụrụ ya kpafuru akpafu. (Luk 15:4-7) Ihe a na-egosi ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ha nọ. (Jere. 23:3, 4) E wezụga ndị okenye, anyị niile nwekwara ike ịgba ụdị ndị a ume. Jehova na-enwe obi ụtọ maka mbọ ọ bụla anyị gbara iji nyere ụdị ndị a aka, ọ ga-akwụkwa anyị ụgwọ maka ya. (Ilu 19:17; Ọrụ 20:35) Ugbu a, chee echiche ma ò nwere onye i nwere ike ịgba ume, egbukwala oge ịga gbaa onye ahụ ume.
LEENỤ VIDIO BỤ́ NA-ENYERE NDỊ NA-ADỊKWAGHỊ EJE OZI AKA, ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:
Olee ihe nwanna nwaanyị Abbey mere mgbe ọ hụrụ nwanna ọ na-amaghị?
Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị gwa ndị okenye ma ọ bụrụ na o nwere onye na-adịghị ejekwa ozi anyị chọrọ inyere aka?
Olee otú nwanna nwaanyị Abbey si kwadebe maka ịhụ Laura nke ugboro abụọ?
Olee otú nwanna nwaanyị Abbey si jiri ndidi na ịhụnanya nọgide na-agba Laura ume?
Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe atụ Jizọs mere na Luk 15:8-10?
Olee uru mbọ niile a gbara iji nyere Laura aka bara?