OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Gịnị Mere I Ji Hụ Ofufe Dị Ọcha n’Anya?
Ọhụụ ụlọ nsọ Ezikiel gbara ndị Juu a dọọrọ n’agha ume n’ihi na o mere ka obi sie ha ike na a ga-eweghachi ofufe dị ọcha. N’oge ikpeazụ a, e meela ka ofufe dị ọcha “guzosie ike n’ebe dị elu karịa ugwu ukwu niile.” Anyị sokwa ná ndị si ná mba niile nubara n’ime ya. (Aịza. 2:2) Ihe ọma Jehova meere gị gị amata ya ma na-efekwa ya, Ị̀ na-echebara ya echiche mgbe niile?
URU NDỊ ANYỊ NA-ERITA N’OFUFE DỊ ỌCHA:
Azịza nke ajụjụ ndị na-enye anyị nsogbu n’obi, ndụmọdụ ndị na-enyere anyị aka inwe olileanya na ibi ndụ dị mma.—Aịza. 48:17, 18; 65:13; Rom 15:4
Ụmụnna zuru ụwa ọnụ na-ahụ n’anya.—Ọma 133:1; Jọn 13:35
Ohere nke iso Chineke na-arụkọ ọrụ ọnụ n’ọrụ na-eme obi ụtọ.—Ọrụ 20:35; 1 Kọr. 3:9
“Udo nke Chineke” na-enyere anyị aka n’ọnwụnwa ndị tara akpụ.—Fil. 4: 6, 7
Akọ na uche dị ọcha.—2 Tim. 1:3
‘Mmekọrịta chiri anya anyị na Jehova nwere.’—Ọma 25:14
Olee ụzọ ndị m nwere ike isi gosi na m ji ofufe dị ọcha kpọrọ ihe?