Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • mwb17 Ọktoba p. 3
  • Otú Ị Ga-esi Bụrụ Onye Na-amụchi Okwu Chineke Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Ị Ga-esi Bụrụ Onye Na-amụchi Okwu Chineke Anya
  • Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2017
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jehova Ekwee Daniel Nkwa Ụgwọ Ọrụ Magburu Onwe Ya
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Gị n’Ezie?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Gị na Akwụkwọ Daniel
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
  • Ịmata Ndị Na-efe Ezi Ofufe na Mgbe Ọgwụgwụ
    Ṅaa Ntị n’Amụma Daniel!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2017
mwb17 Ọktoba p. 3

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Ị Ga-esi Bụrụ Onye Na-amụchi Okwu Chineke Anya

Ị̀ ga-achọ inwe okwukwe siri ike ka Daniel ma ọnwụnwa bịaara gị? Daniel mụchiri Okwu Chineke anya, ma amụma ndị siri ike nghọta dị na ya. (Dan. 9:⁠2) Ịmụchi Baịbụl anya nwere ike ime ka okwukwe gị sie ezigbo ike. Olee otú ọ ga-esi eme ya? O nwere ike ime ka obi sikwuo gị ike na nkwa ndị Jehova kwere ga-emezu. (Jọsh. 23:14) O nwekwara ike inyere gị aka mee ka ị hụkwuo Jehova n’anya, meekwa ka ị na-eme ihe dị ya mma. (Ọma 97:10) Ma, olee ebe ị ga-ebido? Ka anyị leba anya n’azịza ajụjụ ndị na-esonụ.

Ebe Daniel nọ na-agụ Okwu Chineke
  • Gịnị ka m ga na-amụ? Ịna-akwadebe ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe sokwa na ya. Ọgụgụ Baịbụl na-akacha aba uru ma ọ bụrụ na i wepụta oge mee nchọnchọ n’ihe ndị ịna-aghọtaghị. Ọ na-atọ ụfọdụ ndị ụtọ ime nchọnchọ gbasara amụma Baịbụl dị iche iche, ihe ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ, njem ozi ala ọzọ Pọl na ihe ndị Jehova kere eke. O nwee ka ihe a ga-emere nchọnchọ na Baịbụl si bata gị n’obi ka ị na-emere mkpa gị n’ụbọchị, detuo ya, ma jiri ya mere isiokwu ọmụmụ ihe gị n’oge ọzọ.

  • Olee ebe m ga-achọta ihe ndị m na-achọ? Lee vidio bụ́ Ngwá Ọrụ E Ji Eme Nchọnchọ Iji Chọta Akụ̀ Ime Mmụọ ka ịhụ ebe ụfọdụ. Lee ma ị̀ ga-ejili ha eme nchọnchọ iji chọpụta ọchịchị ndị anụ ọhịa ahụ a kọrọ akụkọ ha na Daniel isi asaa nọchiri anya ha.

  • Awa ole ka m ga-eji na-amụ ihe? Ịmụchi ihe anya na-eme ka okwukwe mmadụ sie ike. O kwe mee, jiri obere oge malite ọmụmụ ihe gị, ma na-agbatị ya nke nta nke nta. Ịmụ Okwu Chineke dị ka igwupụta akụ̀ zọrọ ezo, ka ị na-egwupụta ihe, ka ọ ga na-agụ gị ka i gwuru gawa. (Ilu 2:​3-6) Agụụ ịmụ Okwu Chineke ga na-agụsi gị ike, meekwa ka ịmụ Baịbụl mara gị ahụ́.​—⁠1 Pita 2:⁠2.

    Iji nwetakwuo aro ndị ọzọ ga-eme ka ịmụ ihe na-atọkwu gị ụtọ, gụọ Teta! Eprel-Jun 2012, peeji nke 14-16.

GỊNỊ KA ANỤ ỌHỊA NDỊ DỊ NA DANIEL ISI ASAA NỌCHIRI ANYA HA?

  • Anụ ọhịa yiri ọdụm nwere nku ugo

    Dan. 7:4

  • Anụ ọhịa yiri anụ ọhịa bea kpụ ọgịrịga n’ọnụ ya

    Dan. 7:5

  • Anụ ọhịa yiri agụ owuru nwere isi anọ na nku anọ nke anụ ufe n’azụ ya

    Dan. 7:6

  • Anụ ọhịa na-emenye ụjọ ma dị egwu. O nwere ezé ígwè ndị buru ibu, nweekwa mpi iri

    Dan. 7:7

AJỤJỤ ỌZỌ:

Olee otú ihe e dere na Daniel 7:​8, 24 si mezuo?

Mpi ntakịrị nwere anya na ọnụ pụtara n’etiti mpi iri ahụ, o fopụrụ mpi atọ

NCHỌNCHỌ ỌZỌ:

Gịnị ka anụ ọhịa ndị dị ná Mkpughe isi iri na atọ nọchiri anya ha?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya