Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
ỌKTOBA 2-8
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | DANIEL 7-9
“Amụma Daniel Kwuru Gbasara Ọbịbịa Mesaya”
it-2-E 902 ¶2
Izu Iri Asaa
A kwụsịrị mmebi iwu kpochapụkwa mmehie. Ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Jizọs, na ya ịrịgo n’eluigwe mere ka ‘mmebi iwu kwụsị, kpochapụ mmehie ma kpuchiekwa mmehie.’ (Dan. 9:24) Ọgbụgba ndụ iwu ahụ mere ka o doo anya na ndị Juu bụ ndị mmehie. Ọ mara ha ikpe, meekwa ka ha bụrụ ndị a bụrụ ọnụ n’ihi mmebi iwu ha. Ma, ebe Ọgbụgba Ndụ Iwu ahụ mere ka mmehie dị “ọtụtụ,” ebere na amara Chineke si n’aka Mesaya dị ọtụtụ karịa. (Rom 5:20) Àjà Mesaya chụrụ, mere ka a kagbuo njehie na mmehie ndị chegharịrịnụ, ma wepụkwa ntaramahụhụ ya na ya so.
it-2-E 900 ¶7
Izu Iri Asaa
Ọbịbịa Mesaya Ahụ Mgbe ‘Izu Iri Isii Na Itoolu’ Gachara. “Izu iri isii na abụọ” (Dan. 9:25) ahụ, nke so n’izu iri asaa ahụ, bụ́ ihe nke abụọ a kpọrọ aha n’amaokwu ahụ, ga-ebido na ngwụcha nke “izu asaa.” N’ihi ya, “malite mgbe e kwuru ka e mee ka Jeruselem dị otú ọ dịbu” nakwa ka e wughachi ya ruo mgbe “Mesaya bụ́ Onye Ndú” ga-abịa, bụ izu asaa na “izu” iri isii na abụọ, ya bụ, “izu” iri isii na itoolu. Ọ pụtara narị afọ anọ na iri asatọ na atọ, malite n’afọ 455 T.O.N.K. ruo n’afọ 29 O.N.K. Dị ka e kwuru ná mmalite, ọ bụ n’oge mgbụsị akwụkwọ nke afọ 29 O.N.K., ka e mere Jizọs baptizim na mmiri, e jiri mmụọ nsọ tee ya mmanụ, ya ebidokwa ije ozi ka “Mesaya bụ́ Onye Ndú.”—Luk 3:1, 2, 21, 22.
it-2-E 901 ¶2
Izu Iri Asaa
“A ga-ebipụ” ya n’ọkara izu ahụ. Gabriel gwaziri Daniel, sị: “Mgbe izu iri isii na abụọ ahụ gasịrị, a ga-ebipụ Mesaya, ya agbara aka.” (Dan. 9:26) Ọ bụ ná ngwụcha nke izu ‘asaa na izu iri isii na abụọ’ ahụ, mgbe ihe dị ka afọ atọ na ọkara gachara, ka e bipụrụ Kraịst, ya anwụọ n’elu osisi ịta ahụhụ, hapụ ihe niile o nwere, iji gbapụta ụmụ mmadụ. (Aịza. 53:8) Ihe àmà gosiri na Jizọs kwusara ozi ọma n’ime ọkara mbụ nke “izu” iri asaa ahụ. O nwere ike ịbụ n’oge mgbụsị akwụkwọ nke afọ 32 O.N.K., ka Jizọs mere ihe atụ o ji ndị Juu tụnyere osisi fig na-amịghị mkpụrụ ọ bụla “afọ atọ.” (tụlee Mat. 17:15-20; 21:18, 19, 43) Onye ọrụ ubi vaịn ahụ gwara onye nwe ubi vaịn ahụ, sị: “Nna m ukwu, hapụkwuo ya afọ a, ruo mgbe m ga-egwu ala gburugburu ya ma tinye nsị anụ; ọ bụrụkwa na o mechaa mịa mkpụrụ n’ọdịnihu, nke ahụ amaka; ma ọ bụrụ na ọ mịghị, gị egbutuo ya.” (Luk 13:6-9) O nwere ike ịbụ na ihe o ji ihe atụ a na-ekwu gbasara afọ atọ na ọkara ahụ o ji zie ha ozi ọma, ma ha egeghị ya ntị.
it-2-E 901 ¶5
Izu Iri Asaa
“Ọkara izu ahụ” ga-abụ n’etiti afọ asaa ahụ, ma ọ bụ mgbe afọ atọ na ọkara n’ime afọ nke “izu” ahụ gachara. Ebe ọ bụ na “izu” iri asaa ahụ malitere n’oge mgbụsị akwụkwọ nke afọ 29 O.N.K., mgbe e mere Jizọs baptizim, teekwa ya mmanụ o ji ghọọ Kraist; ọkara nke izu ahụ (ya bụ, afọ atọ na ọkara) ga-abanye n’oge opupu ihe ubi nke afọ 33 O.N.K., ma ọ bụ oge Ememe Ngabiga (Naịsan 14) nke afọ ahụ. Kalenda nke Gregory gosiri na ụbọchị ahụ nwere ike ịbụ abalị mbụ n’ọnwa Eprel nke afọ 33 O.N.K. (Gụọ NRI ANYASỊ NKE ONYENWE ANYỊ [Oge a malitere ya].) Pọl onyeozi gwara anyị na Jizọs ‘bịara ime uche Chineke,’ ya bụ, ‘iwepụ nke mbụ [àjà na onyinye ndị dabeere n’Iwu ahụ] ka o wee mee ka nke abụọ guzosie ike.’ O ji ahụ́ ya chụọ àjà iji mee ka ọ dị irè.—Hib. 10:1-10.
ỌKTOBA 16-22
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
g05 9/8 12 ¶2
Mgbe Udo na Ịdị n’Otu Ga-ejupụta Ụwa
N’eziokwu, ụdị udo ga-adị n’ụwa mgbe ahụ ga-abụ nke a na-enwetụbeghị ụdị ya mbụ. Chineke ga-akụziri ndị na-erubere ya isi otú ha ga-esi na-elekọta ihe niile dị n’ụwa a nke ọma. E nwere ike ikwu na Chineke na ụmụ anụ ọhịa dị iche iche “ga-agba ndụ” otú ga-eme ka ha na ụmụ mmadụ na-ebi n’udo, ha a na-erubekwa isi.—Hosia 2:18; Jenesis 1:26-28; Aịzaya 11:6-8.