AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌRỤ NDỊOZI 1-3
Chineke Awụkwasị Ọgbakọ Ndị Kraịst Mmụọ Nsọ
Ọtụtụ ndị Juu nọ na Jeruselem na Pentikọst nke afọ 33 si mba dị iche iche bịa. (Ọrụ 2:9-11) Ha na-edebe Iwu Mozis n’agbanyeghị na o nwere ike ịbụ na ha bi ná mba ọzọ kemgbe a mụrụ ha. (Jere. 44:1) N’ihi ya, ụfọdụ nwere ike yie ndị obodo ha bi na ya, ha nwekwara ike ịna-asụ asụsụ ndị obodo ahụ kama ịsụ nke ndị Juu. Mgbe e mere puku mmadụ atọ n’ime ìgwè mmadụ a si mba dị iche iche baptizim, a bịaziri nwee ụdị ndị iche iche n’ọgbakọ Ndị Kraist. N’agbanyeghị na ha si ebe dị iche iche, ‘ha ji otu obi na-anọ mgbe niile n’ụlọ nsọ.’—Ọrụ 2:46.
Olee otú ị ga-esi egosi na i nwere mmasị n’ebe . . .
ndị si obodo ọzọ nọ n’ebe ọgbakọ unu na-ezi ozi ọma nọ?
ụmụnna nọ n’ọgbakọ unu, na-abụghị ndị obodo unu?