Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
DISEMBA 3-9
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
ihe a kọwara n’Ọrụ 10:6, nwtsty
Saịmọn, onye na-esiji akpụkpọ anụ: Onye na-esiji akpụkpọ anụ na-abanye akpụkpọ anụ ọ chọrọ isiji na mmiri e tinyere ihe ga-eme ka ajị, uru ahụ́ na abụba dị n’akpụkpọ anụ ahụ pụọ. Ya mechaa, ọ na-abanyezi ya na kemikal iji mee ka ọ dị mma maka iji ya arụ ihe dị iche iche. Isiji akpụkpọ anụ na-eme ka gburugburu ebe a nọ na-eme ya na-esi ísì ọjọọ. Inwe nnukwu mmiri dị onye na-esiji akpụkpọ anụ ezigbo mkpa. Ọ ga-abụ ya mere Saịmọn ji biri n’akụkụ oké osimiri, eleghị anya, ná mpụga obodo Jọpa. Iwu Mozis kwuru na ọ bụrụ na mmadụ emetụ ozu anụmanụ aka, onye ahụ ga-aghọ onye na-adịghị ọcha. (Lev. 5:2; 11:39) Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị Juu ji eleda onye na-esiji akpụkpọ anụ anya, obi agaghịkwa eru ha ala ịga biri n’ụlọ onye ahụ. Otu akwụkwọ okpukpe ndị Juu a na-akpọ Talmud mechadịrị kwuo na ọ ka mma na aka ọrụ mmadụ bụ ịna-ekpo nsị́ anụmanụ karịa ịbụ ịna-esiji akpụkpọ anụ. Ma Pita ekweghị ka otú a ndị mmadụ si ele onye na-esiji akpụkpọ anụ anya mee ka ọ ghara ịga nọrọ na nke Saịmọn. Ụdị obi a Pita nwere ịnabata ụdị mmadụ ọ bụla mere ka ọ dị njikere maka ọrụ ọzọ Chineke chọrọ inye ya, ya bụ, ịga n’ụlọ onye Jentaịl. Ụfọdụ ndị ọkachamara na-ekwu na okwu Grik a sụgharịrị “onye na-esiji akpụkpọ anụ” (byr·seusʹ) bụ aha ọzọ a na-akpọ Saịmọn.
DISEMBA 10-16
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
ihe ụfọdụ a kọwara n’Ọrụ 13:9, nwtsty
Sọl, onye bụkwa Pọl: Si n’amaokwu a gawa, a kpọwaziri Sọl, Pọl. Onyeozi a bụ onye Hibru, ma o si n’ọmụmụ nweta ikike ịbụ nwa amaala Rom. (Ọrụ 22:27, 28; Fil. 3:5) N’ihi ya, o nwere ike ịbụ na malite mgbe ọ bụ nwata, ọ na-aza aha Hibru ya bụ́ Sọl nakwa aha Rom ya bụ́ Pọl. N’oge ahụ, ụfọdụ ndị Juu, karịchaa ndị nke na-ebighị n’Izrel na-enwekarị aha abụọ. (Ọrụ 12:12; 13:1) Ụfọdụ ndị ikwu Pọl nwekwara aha Rom ma ọ bụ aha Grik ha na-aza. (Rom 16:7, 21) E nyere Pọl ọrụ izi ndị na-abụghị ndị Juu ozi ọma, ebe ọ bụ “onyeozi nke ndị mba ọzọ.” (Rom 11:13) O nwere ike ịbụ na ihe mere o ji kpebie ịzawazi aha Rom ya bụ na o chere na ọ ga-eme ka ndị mba ọzọ ọ na-aga ikwusara ozi ọma nabata ya. (Ọrụ 9:15; Gal. 2:7, 8) Ụfọdụ ndị kwuru na ọ malitere ịza aha Rom ya iji kwanyere Sajiọs Pọlọs ùgwù. Ma ọ dighị ka ọ̀ bụ eziokwu ebe ọ bụ na Pọl nọgidere na-aza aha a mgbe ọ pụchara na Saịprọs. Ụfọdụ ndị kwukwara na Pọl azaghị aha Hibru ya n’ihi otú o si ada ma ndị Grik kpọọ ya. O yiri okwu ha ji akọwa onye na-eji mpako aga ije ma ọ bụ anụmanụ na-akpa nganga ma ọ na-aga ije.—Ọrụ 7:58.
Pọl: Aha a bụ́ Pauʹlos ma ọ bụ Pọl si n’okwu Latịn bụ́ Paulus nke pụtara “Ntakịrị̇.” N’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst nke dị n’asụsụ Igbo, aha a pụtara ugboro 158 mgbe a na-ekwu banyere Pọl onyeozi, pụta otu ugboro mgbe a na-ekwu gbasara onye na-achị ogbe Saịprọs bụ́ Sajiọs Pọlọs.—Ọrụ 13:7.
DISEMBA 17-23
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
ihe a kọwara n’Ọrụ 16:37, nwtsty
anyị bụ́ ndị Rom: Ya bụ, ụmụ amaala Rom. Pọl bụ nwa amaala Rom, o nwekwara ike ịbụ na Saịlas bụkwa nwa amaala Rom. Iwu ndị Rom kwuru na e boo nwa amaala Rom ọ bụla ebubo, e kwesịrị ibu ụzọ kpee ya ikpe tupu a taa ya ahụhụ, e kwesịghịkwa ịta ya ahụhụ n’ihu ọha n’ebughị ụzọ maa ya ikpe. O nwere ikike ụfọdụ nwa amaala Rom ọ bụla nwere nakwa ihe ruuru nwa amaala ya ọ bụla, n’ebe niile ndị Rom na-achị. Iwu ji nwa amaala Rom idebe Iwu Ndị Rom, ọ bụghị nke obodo ndị ahụ ndị Rom na-achị. Ọ bụrụ na e kwuru na o nwere iwu ọ dara, o nwere ike ikwe ka e jiri iwu ndị obodo ọ nọ na ya kpee ya ikpe. Ma, ọ ka nwekwara ikike ikwu ka e kpee ya ikpe n’ụlọikpe ndị Rom. Ma, a maa ya ikpe ọnwụ, o nwere ikike ikwu na ọ chọrọ ka eze ukwu Rom kpegharịa ikpe ya. Pọl onyeozi kwusara ozi ọma nke ọma n’ebe niile ndị Rom na-achị. Baịbụl kwuru ugboro atọ o ji ọbụbụ ọ bụ nwa amaala Rom mee ihe iji kwusaa ozi ọma. Nke mbụ bụ mgbe ọ gwara ndị ọkàikpe Filipaị na ụtarị ha pịara ya megidere iwu n’ihi na ọ bụ nwa amaala Rom.—Ị chọọ ịhụ ebe abụọ ndị nke ọzọ, gụọ w15 3/1 12 ¶3.
DISEMBA 24-30
AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ỌRỤ NDỊOZI 17-18
“Ṅomie Otú Pọl Si Ekwusa Ozi Ọma na Otú O Si Akụzi Ihe”
ihe ụfọdụ a kọwara n’Ọrụ 17:2, 3, nwtsty
na-atụgharị uche: Ihe Pọl mere abụghị naanị izi ha ozi ọma. Ọ kọwara ihe ọ na-ekwu nke ọma ma sikwa n’Akwụkwọ Nsọ, ya bụ, n’Akwụkwọ Nsọ Hibru gosi na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu. Ihe Pọl onyeozi na-eme abụghị naanị ịgụrụ ndị ọ na-agwa okwu Akwụkwọ Nsọ, kama, ọ na-eso ha tụgharịa uche n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, kọwaakwa ya otú ha ga-aghọta ihe ọ na-ekwu. Okwu Grik bụ́ di·a·leʹgo·mai pụtara “mmadụ na ibe ya ikwurịta okwu.” Ọ pụtakwara ịgwa ndị ọzọ okwu. A sụgharịrị otu okwu Grik a n’Ọrụ 17:17; 18:4, 19; 19:8, 9; 20:7, 9.
ma jiri ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ na-egosi: Okwu Grik e si sụgharịta ya pụtara n’ụzọ nkịtị “idebe ihe n’akụkụ.” Ọ ga-abụ na Pọl ji nlezianya tụlee amụma ndị e buru gbasara Mezaya ahụ n’Akwụkwọ Nsọ Hibru nakwa ihe ndị mere ná ndụ Jizọs, jirizie ya gosi otú Jizọs si mezuo amụma ndị ahụ.
ihe a kọwara n’Ọrụ 17:17, nwtsty
n’ọma ahịa: Ọ bụ n’Akrọpọlis ka ọma ahịa (na Grik, a·go·raʹ) ndị Atens dị. Ọ hà ka ebe a na-agba bọl ụzọ itoolu. Ọ bụghị naanị ịzụ na ire ahịa ka a na-eme n’ebe ahụ. Ọ bụ ebe ha na-anọ achụ ego, eme ihe gbasara ọchịchị na omenala. Ọ na-atọ ndị Atens gụrụ oké akwụkwọ ụtọ izukọta n’ebe ahụ na-akparịta ụka.
ihe a kọwara n’Ọrụ 17:22, 23, nwtsty
Nye Chi A Na-amaghị Ama: Okwu Grik ndị bụ́ A·gnoʹstoi the·oiʹ so n’ihe e dere n’ebe ịchụàjà ahụ dị na Atens. Ndị Atens na-ewu ụlọ nsọ na ebe ịchụàjà dị iche iche n’ihi egwu ha na-atụ chi ha dị iche iche. Ha wudịrị ebe ịchụàjà maka chi ụfọdụ ha chere na ha dị adị dị ka, chi Na-eme Ka Mmadụ Bụrụ Onye A Ma Ama, chi Ịdị Umeala n’Obi, chi Ike, chi Mmanye, na chi Imetere Mmadụ Ebere. O nwere ike ịbụ na ihe mere ha ji wuo ebe ịchuàjà ma nyefee ya “Chi A Na-amaghị Ama” bụ́ na ha na-atụ ụjọ na chi nke ha na-amaghị na ọ dị nwere ike iwesa ha iwe ma ọ bụrụ na ha arụghịrị ya ụlọ. Ịrụrụ chi ha na-amaghị ụlọ gosiri na ha kwetara na e nwere Chi ha na-amaghị banyere ya. Pọl jizi ebe ịchụàjà a ha rụrụ mere ihe o ji malite ịgwa ndị Atens banyere Chi ahụ, ya bụ, ezi Chineke ahụ ha na-amaghị ruo mgbe ahụ.
Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke
ihe a kọwara n’Ọrụ 18:21, nwtsty
ọ bụrụ uche Jehova: Okwu a gosiri na anyị kwesịrị ịna-achọ ịma ihe bụ́ uche Chineke n’ihe ọ bụla anyị na-eme ma ọ bụ n’ihe ọ bụla anyị chọrọ ime. Ọ bụ ihe Pọl onyeozi na-eme. (1 Kọr. 4:19; 16:7; Hib. 6:3) Jems, onye na-eso ụzọ Jizọs gbakwara anyị ume ịna-ekwu, sị: “Ọ bụrụ uche Jehova, anyị ga-adị ndụ wee mee nke a ma ọ bụ nke ọzọ.” (Jems 4:15) E kwesighị iwere ụdị okwu a ka okwu nkịtị. Onye ọ bụla si n’ala ala obi ya na-asị “Ọ bụrụ uche Jehova,” ga-agba mbọ na-eme uche Jehova. Ọ dịghị mkpa ka anyị na-ekwupụta ya ekwupụta mgbe niile, ọ bụ ihe a na-ekwukarị n’ime obi.—Gụọkwa Ọrụ 21:14 na sgd isi nke 2.